Etu Yul, Judy Austin Edochie siri kwaa oke arịrị maka ọnwụ nwa ya nwoke

Mgbe e biputara ya

Onye ejije Nollywood a ma ama bụ Yul Edochie ekwuola okwu mbụ banyere nwa ya nwụrụ n’ebe ngwụcha ọnwa Maachị 2023.

N’ozi o zipụtara n’akara Twitter ya n’abalị Tọọzde bụ abalị 28 nke ọnwa Eprel, 2023, ọ kwara arịrị maka ọnwa nwa ya bụ Kambilichukwu Yul-Edochie ma dee:

“Anyị mara nkarị maka ogologo gị tupu ị pụọ gawa ụlọakwụkwọ mana ị lọghachịtezi ọzọ.”

“Agaghị m ajụ Chukwu ajụjụ. Ezi nwaa m, naanị afọ 16 ị nọrọ n’ụwa mana ị hụrụ ụkpụrụ ọma.”

Ozi kọwara etu ya na nwa ya nwoke siri nwee mkparịtaụka n’ụtụtụ Wenezde ahụ ma kwukwa na ọ kwere nwa ya nkwa na ọ ga-abịa asọmpị egwuregwu ụlọ akwụkwọ ha zubere ịme n’ụbọchị Fraịdee ahụ.

Ọ gara n’ihu dee etu ọnwụ nwa ya onye bụkwa di ọkpara ya siri metụta ya nakwa ezinaụlọ ya nke ukwuu:

“Ana m echeta gị, anyị hụrụ gị n’anya.”

Ozi Edozie zipụtara medere obi ọtụtụ ndị mmadụ dịka ha gbakọtara na-ezitere ozi iti aka n'obi n'akara soshal midia ya niile dịka ụfọdụ na-ekwu, ọnwụ a metụtara ha nke ukwu.

N'otu aka ahụ, nwunye Edochie nke abụọ bụ Judy Austin Yul Edochie zipụtakwara ozi n'ụtụtụ Fraịde a ma dee:

'Chukwu bụ onye ma ihe kacha ma'

'Kambi Yul-Edochie, ezigbo nwa, zuo ike n'eligwe n'aka Chukwu'.

N'ozi ya, o tinyere foto gosiri ọkụ na-anyụ anyụ nke bụ ihe njirimara ọtụtụ ji egosi iru uju na soshal midia.

Judy Austin na-emekwa ejije na Nollywood, mgbe Yul Edochie zipụtara ozi na ha abụọ na-alụ n'afọ 2022, ọtụtụ okwu dapụtara n'ọha banyere nke a mana ha abụọ kwuru na ha hụrụ onwe ya n'anya ma kwudoro onwe ha.

Etu ọha siri nụ maka ọnwa a

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Legọs steeti bụ David Hundeyin gbara ama na Maachị na n'ezie na nwa Yul Edochie bụ onye ejije ama ama aha ya bụ Kambilichukwu Yul-Edochie anwụọla.

Nke a na-eso dịka Yul gara ụlọorụ ndị uweojii nke nọ n'ebe o bi gwa ha maka ọnwụ nwa ya nwoke.

Hundeyin kwuru na ya bụ nwatakịrị nwụrụ n'ogige ụlọakwụkwọ ya ma sị na ha ebidola nyocha ha.

O kwukwara na ha ga-eme nyocha a na-eme ozu iji mara ihe gburu ya.

O kwukwara na ya bụ okwu ga-anọzị n'aka ngalaba uweojii nke Criminal Investigation Department site n'ụbọchị 31 nke ọnwa Maachị 2023.

Ihe anyị ma maka ọnwụ nwa Yul Edochie

Onye bụ Yul Edochie?

Yul Chibuike Daniel Edochie bụ onye ama dịka onye na-eme ihe ejije na Naịjirịa.

A mụrụ ya n'ụbọchị 7 nke ọnwa Jenụwarị afọ 1982. Yul bụ onye Anambra Steeti.

Nna ya bụ ọkaibe maka ejije bụ Pete Edochie bụ onye ama ama na-eme kwa ihe ejije na Naịjirịa.

Ewepụ ihe ejijje, Yul bụ kwa onye ndọrọndọrọ ọchichị.

O kwuru na ọ lụrụ nwunye ya aha ya bụ May mgbe ọ dị afọ 22 kama n'afọ 2022 ka o kwuputara na nwaanyị ọzọ mụrụ ya nwa nwoke.

Nke a butere ọtụtụ ọkwu dịka ya bụ ozi tụrụ ndị Naijirịa n'anya.

Nke a mere ka nwunye ya dee na soshal Midịa ya sị, " Ọ bụ Chukwu ga-ekpe unu ikpe".

May Yul-Edochie

Yul lụrụ May dịka nwunye ya n'afọ 2004.

N'afọ 2021 ka Yul dere n'akara Instragm ya na nwunye ya bụ May Yul-Edochie lụrụ ya mgbe ọ na-enweghị ihe ọ nwere. O dere sịọ na nwunye ya na eme ka ndụ na-atọ ya ụtọ.

May mụtara Yul ụmụ anọ, ndị ikom atọ na otu nwaanyị na alụmdịnanwunye ha nọrọla afọ iri na asaa.

May depụtara n'akara Instagram ya na ọ bụ onye ji ego achụ ego.