Enugwu steeti: Ụmụnwaanyị Awgu emeela ngagharịiwe sị na ndị ọchụehi na-egbu ha, ama ha elu n'ike

Ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, Law Njoku

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụmụnwaanyị Ugwuleshi dị n'okpuru ọchịchị Awgu, n'Enugwu steeti emeela ngaharịiwe maka ọnọdụ ha na mkpamkpa ndị na-achị ehi na-akpa n'obodo ha.

Ọtụtụ n'ime ndị mere ngagharịiwe ahụ na-ebo ndị na-achị ehi ebubo Iwakpo obodo ha, ịma ụmụnwaanyị elu n'ike, igbu mmadụ nakwa imebi ọrụ ugbo ha.

N'oge ha pụtara n'igwe na-eme ngagharịiwe ahụ, ọtụtụ n'ime ha na-akwa akwa, na-agụ egwu arịrị ma na-arịọ ka a gbatara ha ọsọ enyemaka.

Ha ji ọkọlọtọ dị icheiche n'aka na-egosi iwe ha.

N'ime ihe ha dere n'ọkọlọtọ ahụ gunyere na ndị ọchụ ehi alaala ọtụtụ ndụ ụmụ mmadụ n'inyi ma na-ama ọtụtụ ụmụnwaanyị elu n'ike.

Etu ngagharịiwe si bido

N'ọnwa Mee, abalị 13 n'afọ 2025 ka ụmụnwaanyị ndị ahụ gbakọrọ ọnụ gaa besara onye isi oche gọọmenti okpuru ọchịchị Awgu akwa.

N'ebe ahụ ka ha nọ kwuo na ha adịghịzị aga ugbo ma ọ bụ wepụta ihe ha kọrọ n'ụbi maka mkpamkpa ndị ọchịehi na-akpa.

Ha sị na nke a mere na agụụ na-achọzị igbu ha.

Otu onye n'ụmụnwaanyị ahụ bụ oriaku Felicia Okompi kwuru sị "anyị bụ ndị ọrụ ugbo, mana ndị ọchi ehi ewerela ehi ha tachasia ihe anyi kọrọ n'ugbo".

"Ehi ha tara ma ji, ede, akpụ, osikapa, na ihe ndị ọzọ, ugbua anyị ahụghịzị nrị anyị ga-enye ụmụaka anyị"

Ọ gara n'ihu kwuo na "cheta na 2023 ndị ọchị ehi gburu ụmụ okorobia anyị abụọ bụ Onyeka Chukwu na Chidozie Friday".

"E gburu ha mgbe ha gara ugbi ha. Ndị ọchụehi wakporo ha, nwere mma gbukasia anụ ha ma gbuo ha ebe ahụ".

Ọ gara n'ihu kwuo na Victor Okafor onye nke gbanarịrị bu apa mma n'ahụ ya niile tinyekwara na ndị ọchiehi ahụ gbupuru ya mkpisi aka ole ma ole.

Otu onye ọzọkwa ha gburu mma oge adighị anya bụ Ngozika okolie.

Ndị meruru ahụ n'oge ndị ọchụ ehi wakporo Awgu, n'Enugwu

Ebe foto si, Law Njoku

Nkọwa foto, Ndị meruru ahụ n'oge ndị ọchụ ehi wakporo Awgu, n'Enugwu

Ihe eze obodo ha kwuru

Eze obodo Ugwuleshi bụ Igwe Nwobi yọrọ onyeisi uweojii kpata kpata ka ọ gbatara obodo ya ọsọ enyemaka n'ihi na egwu jizi onye ọbụla aka.

Igwe Nwobi kwara akwa arịrị sị na ogbugbu ma mwakpo ndị obodo ha malitere kamgbe afọ 2016.

Ọ sị na nke a ebutela ọnwụ ọtụtụ ndị obodo. Ọ yọkwara ndị Uweojii ka ha tọhapụ mmadụ abụọ ha ji eji maka ebubo ọnwụ otu onye ọchụehi.

Lee ọsịsa Onyeisi oche gọọmenti okpuru ọchịchị Awgu nyere

Onye isioche gọọmenti okpuru ọchịchị Awgu bụ Uche Okolo kwere ha nkwa na ọchichi ya ga-enweta nchekwa na udo ebe ahụ.

Uche kọwara na ha akpọkọtara ndị niile ọ gbasara na nzụkọ ka e nwere chọta udo na mpaghara ahụ.

Okolo kwuru na ndị niile meruru ahụ na ya bụ nwakpọ ga enweta ọgwụgwọ n'ụlọ ọgwụ n'efu, wee yọọ ndị Ugwuleshi Awgu ka ha dere jụụ hapụrụ gọọmeni ọrụ iweta udo tọrọ atọ n'etiti ha na ndị na-achị ehi.