Etu aka si kpara Charles Chukwuma Onwuemelie ka ọ gara ohi nke ugboro 69 n'Amerịka

Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii mba Amerịka anwụchiela Charles Chukwuma Onwuemelie, bụ otu nwamadi ha na-ebo ebubo izu ndị mmadụ ohi.

Ndị ngalaba uweojii 'Los Angeles Police Department’s Robbery-Homicide Division (RHD)' nke mba Amerịka wepụtara ozi ebe ha kọwara etu aka ha si kpara Onwuemelie a ma dịka 'Blue cloth bandit'.

Dịka ha si kwuo, kemgbe ọnwa Ọktoba afọ 2021 ka ha malitere ịchọ ya bụ 'blue cloth bandit', wee chọpụta na ohi ruru 68 e zurula na mpaghara Los Angeles County na City of Los Angeles, bụ ya zuchara ha.

Nnyocha ha mere gosiri na ya bụ 'blue cloth bandit' na-eji akwa na-acha anụnụ anụnụ wee na-ekpuchi egbe ọ na-egosi ndị mmadụ tupu o zuo ha ohi.

Ha chọpụtakwara na ọ na-ekpukwa okpu dị iche iche, yiri mkpuchi imi ma yirikwa 'glove' rọba n'aka, mgbe ọ na-ezu ohi n'ụlọahịa ndị dịka Walmart nakwa ọdọmmanụ ụgbọala.

Ha kwuru na ha chọpụtakwara na o ji otu ụgbọala gaa ọtụtụ ohi ndị ahụ ọ gara.

Etu e si nwụchie ya

Dịka ndị uweojii LAPD si kwuo, ha chebirila Onwuemelie n'ụbọchị Fraịde, 23 nke ọnwa Septemba afọ 2022, ka ọ gachara ohi ebe ọzọ.

Ka o zuchara ya bụ ohi, ha amalite ide ya ma nata ikike inwụchi ya.

Ha derela ya ruo n'ụlọ ya ebe ha chọtara ngwaọrụ o ji aga ohi, gụnyekwara egbe ya.

A kpụpụrụ ya ụlọikpe n'ụbọchị 27 nke ọnwa Septemba, maka ohi nke o zuru na City of Los Angeles.

Ihe anyị maka Charles Chukwuma Onwuemelie

Charles Chukwuma Onwuemelie ka lụrụ nwaanyị n'ọnwa Julaị afọ 2022.

Dịka ndị uweojii si kwuo, ọ dị afọ 29 ugbua.