Lee ọrụ pụrụ iche ndị Ada na-arụ n’ọmenala Igbo
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Mgbe e biputara ya
Chukwunaeme Obiejesi
Journalist, Igbo Service

Ebe foto si, Iwaria
Ụbọchị iri nke ọnwa Ọkụtoba afọ ọbụla bụ ụbọchị e wepụtara iche iji cheta ụmụ aka ụmụnwaanyị n'ụwa niile, nke a na-akpọ 'International Day of the Girl Child'.
Mana n'omenala Igbo, ịkwanyere ụmụnwaanyị ugwu abụghị ihe ọhụrụ, ọ bụ ihe dị ọkpụtọrọkpụ kamgbe ndị nna nna anyị ha.
Nwa nwaanyị ọbụla a mụrụ n’ala Igbo bụ ‘Ada’ n’ezịnụlọ a mụrụ ya nakwa n’obodo ya.
Nke a mere otu a na-akpọ ‘Ụmụ Ada’ ji bụrụ otu jikọrọ ụmụnwaanyị niile a mụrụ n’obodo.
Mana abịaruo n’ime ezinụlọ, onye a na-akpọ ‘Ada’ bụ nwa nwaanyị mbụ a mụrụ n’ezinụlọ ahụ.
Ọ bụ eziokwu na ụmụnwaanyị niile a mụrụ n’ezinụlọ bụcha ‘Ada’, mana onye bụ ‘Isi Ada’ bụ nwa nwaanyị nke mbụ.
N’omenala Igbo, ndị bụ Ada bụ ndị a na-akwanyere nnukwu ugwu n’ihi ọrụ pụrụ iche ha na-arụ. E nwere ụdị ihe ga-emee n’ezinụlọ, ihe mbụ ndị okenye ga-ajụ bụ, “ebee ka Ada nọ”? Maọbụ a sị “chere ka Ada bịaruo."
Lee ọrụ Ada na-arụ n'ezinụlọ
Onye nlere anya maka ụmụnne ya

Ebe foto si, Iwaria
Ọrụ mbụ Ada na-arụ bụ ịbụ onye nlere anya nye ụmụnne ya ndị ọ tọrọ.
Nwokocha Benedicta Akuezi, onye obodo Umuarugwu Eziala Ogwu dị na Nguru Nwenkwo Ogwu, Mbaise, kwuru na ọ bụ ọrụ dịịrị nwaanyị mbụ n'Ezinụlọ ị na-akpa ezi agwa ka ụmụnne ya ndị ọ tọrọ wee na-elegara ya anya.
"Ọ bụrụ na Ada kpawa agwa ọjọọ, a ga-ajụ ya sị: "gịnị ka ị chọrọ ka ụmụnne gị ndị ị tọrọ mee"?
Onye mkpebi ikpe

Ebe foto si, Iwaria
Ọrịakụ Akuezi kwukwara na ọrụ ọzọ dị mkpa Ada na-arụ bụ ikpe udo n'ezinụlọ n'oge nghọtahie.
"Ada bụ onye ọ dịịrị ikpeziri ụmụnne ya ma ọ bụrụ na esemokwu dapụta," Akuezi kwuru.
"Nke a bụ maka na a tụrụ anya na Ada ga-abụ onye eziokwu na onye ikpe ziri ezi; ọ bụghị onye ga-ahụ ihe dị oji sị na ọ dị ọcha."
N'otu aka ahụ, Celestina Nnennaya, kwuru na ọ bụ maka ịkwụwa aka ọtọ nakwa ikwu eziokwu a mere otu "ụmụada" ji bụrụ otu a na-akwanyere nnukwu ugwu n'omenala Igbo.
"Onweghị ikpe siri ike nke "ụmụada" na-enweghị ike ikpezi. Onweghị onye ọbụla n'obodo nke "ụmụada" ga-asọ anya ịgwa ya eziokwu," Nnennaya kwuru.
"Otu a ka ọ dịkwa maka onye bụ "isi Ada" n'ime ezinụlọ, ọ naghị ele onye ọbụla anya n'ihu, ọrụ ya bụ ịkwụrụ n'eziokwu oge niile."
Onye na-ele nne ya nka

Ebe foto si, Getty Images
N'omenala Igbo, ọ bụ ọrụ dịịrị nwa nwaanyị nke mbụ ilekwa nne ya n'oge nka.
Celestina Nnennaya kwuru sị, "ọ bụrụ na nwaanyị rịawa ọrịa, ihe mbụ a ga-ajụ bụ ma Ada ya amatala maka ọrịa nne ya."
"Nke a bụ maka na ọ bụ ọrụ Ada ilekwa nne ya n'oge ọrịa maọbụ n'oge nka."
"Ọ bụrụkwanụ na nne ya nwụọ, ọ bụ ya ga-eketa akpa akwa nne ya, ma kesazie ya n'etiti ya na ụmụnne ya ndị nwaanyị ndị ọ tọrọ."
N'aka nke ọzọ, onye ọ dịịrị ile nna ya nka dịka omenala Igbo si dị, bụ nwa nwoke nke mbụ.
N'oge olili nne maọbụ nna ya ...
Ọ bụ ọrụ dịịrị nwa nwaanyị nke mbụ izigara ndị Ụmụada obodo ya ozi ma nne ya maọbụ nna ya nwụọ.
Ọbụrụgodu na ụfọdụ ndị nọ n'otu ụmụada anụla maka ya, ha ga-eme ntị ka ha anụghị ruo mgbe isi Ada n'ezịnụlọ ahụ wetaara ha ozi.
Oriaku Nwokocha Benedicta Akuezi kwuru na ọ bụrụ n'obodo ya bụ Nguru Nwenkwo Ogwu, "ọ bụ nwa nwaanyị nke mbụ ga-azụta akpatiozu a ga-eji lie nne ya".
"Ọ bụrụ onye nwere ego ọ ga-eji otu ehi wee zigara ndị ụmụada ozi maka ọnwụ nne ya maọbụ nna ya, mana ihe ndị a adịchaghịzi otu a n'oge ugbua." Akuezi kwuru.




























