Tribunal Judgement: Tinubu emeriela Peter Obi n'ụlọikpe

Mgbe e biputara ya

Ụlọikpe pụrụ iche maka ntuliaka enyela Onyeisiala Bola Tinubu mmeri ma kụpụ n'akụkụ mkpesa nke otu Labour Party(LP) na onye fere ọkọlọtọ pati ahụ na ntuliaka Onyeisiala nke afọ 2023 bụ Peter Obi wetara maka etu ahụ si gaa.

Otu Labour Party na Peter Obi wegara mkpesa n'ụlọikpe iji gbagha mpụtara ntuliaka 2023 nke gụnyere ebubo na e mere nrụrụka aka na ntuliaka ahu, na Tinubu enwetaghị pasent 25 n'Abuja nakwa na o tozughị ịzọ ọkwa onyeisiala dịka a maburu ya ikpe n'ụlọikpe dị na mba Amerịka maka ebubo ibu ọgwụike.

Mana Ọkaikpe Jọstịs Haruna Tsammani onye chịkọtara mkpebi ya na ndị ọkaikpe anọ ndị ọzọ nwere kwuru na o nweghị ihe akaebe gosiri na Peter Obi meriri na ntuliaka ahụ.

Etu ndị mmadụ si nabata mkpebi ahụ

N'okwu iji BVAS na I-Rev zipu mpụtara ntuliaka

Na mkpebi ya n'ikpe ahụ, Ọkaikpe Jọstịs Haruna Tsammani nọ n'isi ikpe ahụ nke ọkaikpe ise chịkọtara kwuru na na ọ bịa na iwu metụtara ntuliaka, na naanị teknuzu ọ dị n'iwu Inec bụ Bimodal Voters Accreditation System (BVAS), na o nweghị ebe ọ dị n'iwu na Inec ga-ejinata igwe BVAs si n' ọdọ atụmvootu zipu mpụtara ntuliaka gaa n'ọbaozi Inec.

Ọkaikpe ahụ bụ onye ji ikpe dị n'etiti Oyetola na Inec were maa atụ sịri na Inec kwụrụ onwe ya ma nwee ikike ịhazi ntuliaka n'usoro ọbụla masịrị ya. O kwuru na iwu Ntuliaka afọ 2022 enweghị ebe o kwuru na a ga-eji igwe zipu mpụtara ntuliaka."

N'okwu 25 % n'Abuja

Jọstịs Haruna Tsammani onye gbadoro ụkwụ na Iwu Naijiria Akụkụ nke 134(2a) (section 134(2a)sịrị inweta pasent 25 n'Abuja na ntuliaka onyeisiala abụghị iwu.

O kwuru na Abuja na steeti ndị ọzọ dị na Naijiria ha nha.

Okwu na Tinubu buru ọgwụike n'Ala Bekee

Ụlọikpe kụchapụrụ ebubo na a nwụchiri Tinubu n’ihi ọgwụike na mba Amerịka.

Ha kwuru na ụlọikpe mba Amerịka amaghị Tinubu ikpe kama na ọ bụ akụnaụba ya ka a na-apụrụ ya maka na a rụrụ ya aka, nke a kpọrọ “civil forfeiture’

Ha kwuru na ndị mere mkpesa egosighi ihe akaebe na a nwụchiri Tinubu n’Amerịka ma ọ bụ maa ya ikpe n’okwu banyere ibu ọgwụike.

Ha kwuru na o nweghi mgbe a kpọpụrụ ya n’ụlọikpe.

Na o nweghi ikpe ọbụla a mara ya, n’ihi nke a na o gbochughi Tinubu ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

A dara Obi, Atiku na APM nha maka iweta 'mkpesa erjughị afọ n'ụlọikpe

Ọ bụghị naanị mkpesa Peter Obi wetara ka ụlọikpe ahụ kpụrụ.

Ndị ọkaikpe ụlọikpe pụrụ iche ahụ kụpụkwara mkpesa nke onye feere otu PDP ọkọlọtọ bụ Atiku Abubakar nakwa nke otu Allied Peoples Movement, (APM).

Dịka Obi, Atiku na otu PDP wetara mkpesa na Tinubu etozughị ịzọ ọkwaonyeisiala n'ihi ebubo na ụlọikpe mba Amerịka mara ya ikpe ịbụ onye mpụ ma napụ ya ego a sị zitere na ibu ọgwụ ike.

APM na mkpesa nke ha na-ebo ebubo na osote Tinubu bụ ọzọrọ ọkwa abụọ n'otu oge ma arịọ ka a kagbuo vootu APC ma kpọpụta Atiku dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.

Ụlọikpe ahụ dara ha nha maka 'iweta mkpesa erijughị afọ.

Obi,Atiku jụrụ mkpebi ụlọikpe mana Tinubu nabatara ya

Otu 'Labour Party' na Peter Obi, PDP na Atiku jụrụ mkpebi ụlọikpe ntuliaka ahụ ma kwuo na ha ga-agbaya .

Mana Tinubu nabatara ya.

Cheta...

Cheta na otu Labour Party, PDP, na APM wegara mkpesa n'ụlọikpe ịgbagha mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala nke Inec kpọụtara Bola Tinubu nke APC dịka onye meriri.

Na abalị mbụ nke ọnwa Maachị afọ 2023, Inec kpọpụtara Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka onyeisiala e mere n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị, afọ 2023.

Dịka Inec si kwuo, Tinubu nwetara vootu dị 8,794,726, Atiku , onye Inec sị gbara onye nke abụọ nwetara vootu 6,984,520, ebe Obi nwetara vootu dị 6,101,533.