Aka m adịghị na mwakpo ụlọ Ikenga Ugochinyere - Chinasa Nwaneri

Mgbe e biputara ya

Onye enyemaka Gọvanọ Imo Steeti n'ọrụ pụrụ iche bụ Chinasa Nwaneri ekwuola na aka ya adịghị na mwakpo ndị ojiegbe wakporo ụlọ Ikenga Ugochinyere n'obodo ya bụ Akokwa, Imo Steeti n'ụbọchị Satọde, Jenụwarị 14 2023.

Nwaneri kwuru nke a na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ BBC Igbo nwere n'ekwentị n'ụbọchị Sọnde, Jenụwarị 15.

Nke a na-abịa dịka otu Peoples Democratic Party (PDP) n'Imo Steeti boro ebubo na Chinasa Nwaneri ma maka mwakpo ahụ mere na be Ugochinyere.

Cheta na Ugochinyere bụ onye ji ọkọlọtọ PDP azọ ọkwa ịnọchite anya mpaghara Ideato North/South n'ụlọ omeiwu Naịjirịa.

N'ebubo ahụ, Collins Opurozor bụ odeakwụkwọ mgbasaozi nke ndị PDP n'Imo Steeti kwuru sị: "Otu onye Hope Uzodinma (Gọvanọ Imo Steeti) were n'ọrụ bụ Chinasa Nwaneri ekwuobuola na ya ga-awakpo Ikenga Ugochinyere ebe ọbụla a hụrụ ya n'Imo Steeti."

Opurozor kwukwara na awakporo ụgbọala Ikenga n'Imo Steeti nụbọchị 23 nke ọnwa Disemba 2022, mana ọ gbara gharịị ihe mere ndị ọrụ nchekwa ji gbachi nkịtị ka ihe ndị a na-eme.

Ihe Nwaneri kwuru gbasara ebubo a

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, nwaneri kwuru na ọ bụ ezie na ya na Ugochinyere nwere obere nghọtahie n'afọ gara aga, mana "dịka onye otu Christ, awụfuola m ihe ndị ahụ niile n'afọ gara aga".

"Enwere m okwukwe na Chineke, ana m efe Chineke, anaghị m eburu mmadụ ihe n'obi.

"Ọ bụ iji kwanyere ugwu mere m ji kpọghachi gị ugbua, ọ bụrụ maka okwu nke ahụ (mwakpo ụlọ Ikenga) onweghị ihe na-esere mụ na onye ọbụla.

"Ihe mere n'afọ gara aga agaala, afọ nke a bụ 2023, e nwere ihe dị iche na 2022 na 2023.

"Agaala m ụka, ma mee ihe ndị ọzọ iji chụọ afọ 2022 ma kelee Chineke maka ndụ o nyere m ka m hụ 2023. Nke a pụtara na ihe ọbụla mere na 2022 abụrụla ihe e chefuru echefu."

BBC kpọkwara Kọmishọna mgbasaozi Imo Steeti bụ Declan Emelumba, ma zigakwara ya ozi n'ekwentị gbasara ebubo a, mana ọ zabeghị anyị ruo ugbua.

'Egbuola nwanne nna m ma gbaa ụlọ m ọkụ' - Ikenga Ugochinyere

Ndị omekome awakpoola ụlọ Ikenga Imo Ugochinyere bụ onye ji ọkọlọtọ otu Peoples Democratic Party (PDP) azọ ọkwa onye nnọchite anya Ideatọ North/South n'ụlọ omeiwu ukwu n'ụtụtụ taa bụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023.

Ikenga zitere onyentaakụkọ BBC Igbo ozi maka ya bụ ihe mere ma gwa ya na ndị omekome a gburu nwanna ya na ya bụ mwakpo.

Ndị akaebe nọ ebe ya bụ ihe mere na-ekwu na opeketempe, na ndị omekome a gbara ihe ruru ụgbọala 30 ọkụ.

Ikenga kpọkuru ndị mmadụ ka ha gbatara ya ọsọ enyemaka mgbe ya bụ ihe na-eme, dịka ọ dere sị, "Anyị chọrọ enyemaka n'Akokwa, Ha na-awakpo anyị ụgbụa, Ha na-awakpo ụlọ m dị n'Akokwa...Ha egbuola nwannam, ha na-agba ihe niile ọkụ. Biko nyere anyị aka".

N'aka nke ọzọ ka ndị otu patị PDP wepụtara akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuchitere ha na steeti ahụ bụ Collins Opuruozor depụtara nke o kwuru sị: "Anyị na-akpoku ndị nchekwa Imo Steeti...ugbua, enwere mwakpo na-eme n'ụlọ Ikenga Imo Ugochinyere bụ onye na-azọ ọkwa Ideato North/South n'ụloomeiwu ukwu."

O depụtara na ya bụ mwakpo ebutela ogbugbu ụfọdụ mmadụ ma gbaa ụlọ na ihe ndị ọzọ ọkụ.

Ọzọkwa a bụrụ na onye enyemaka Ikenga gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo na-enwere ndị ọzọ egburu na ya bụ mwakpo.

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal Midia na-egosi ebe ụfọdụ ndị na-achọ imenyụ ya bụ ọkụ nke na-agba n'akụkụ ụlọ ya nakwa ụfọdụ ụgbọala nọ ebe ahụ.

Dịka o siri dị ugbua, amabeghị ndị kpara ya bụ arụ.

BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Imo steeti bụ Michael Abattam n'ekwe ntị ya maka ihe mere kama ọzaghị.

N'ọnwa Oktoba ka ụlọikpe elu nke dị n'Abuja kụchaoụrụ ikpe otu patị All Progressives Congress gbara n'isi Ikenga Ugochinyere nke na-ekwu na o kwesịghị ịzọ ọkwa onye nnọchiteanya Ideato North/South n'ụlọomeiwu ukwu n'ihi na emere ntuliaka ejiri họpụta ya n'Owerre ebe e kwesịrị ime ya n'ebe ọ na-azọ ọkwa ịnọchite anya ha.

Ọzọkwa abụrụ na n'ọnwa Disemba nke afọ 2022 ka ụlọikpe nke kacha na Naijirịa kpebiri ma kwuo na Ikenga Imo Ugochinyee bụ onye kwesịrị ịnọchite anya otu PDP maka ịzo ọkwa onye nnọchite anya ụlọomeiwu Ideato North na South nke Imo Steeti.

Onye bụ Ikenga Imo Ugochinyere

Ikenga Ugochinyere bụ nwaafọ Akokwa nke dị N'imo Steeti ma bụrụ kwa onye otu patị Peoples Democratic Party.

Ọ bụ ya bụ ọnụ na-ekwuchitere otu ndị na-anọghị n'ọchịchị nke a kpọrọ Coalition of United Political parties (CUPP) .

Ikenga bụkwa onye jị ọkọlọtọ otu PDP azo ọkwa onye nnọchite anya ndị ụlọomeiwu nke Ideato North/South Imo steeti.