Peter Obi ahọrọla Doyin Okupe dịka osote ya nke nchere oge

Peter Obi na Doyin Okupe

Ebe foto si, Peter Obi/Doyin Okupe/Facebook

Mgbe e biputara ya

Peter Obi ahọrọla Doyin Okupe dịka osote ya nke nchere oge.

Otu Laboour Party wepụtara nke a n'akara soshal midia ha taa bụ Fraịde.

Obi mere nke a iji mezuo iwu na-achịkọtọ ntuliaka 2023, dịka ngalaba 'Independent National Electoral Commission' (Inec) si wepụta.

Inec kwuru na ọ bụ taa bụ abalị iri na asaa nke ọnwa Jun bụ ụbọchị ikpeazụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche nwere iji weta aha onye ga-azọ ọkwa onyeisiala nakwa osote ya.

Ọ bụrụ na taa gafee, pati ọbụla na-ewetaghị aha ndị nke ha, ya bụ ntuliaka kwaala ha.

Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ pati ndị ọzọ tinyekwara aha nchereoge dịka osote onyeisiala.

Bola Tinubu nke 'All Progressives Congress' tinyekwara aha nchereoge dịka osote onyeisiala ya, mana ha ekwupụtabeghi onye ọ bụ.

Mana ụlọntaakụkọ Arise TV na-ekwu na onye Tinubu tinyere aha ya bụ nwa amadi aha ya bụ Kabir Ibrahim Masari.

Gịnị ka iwu ntuliaka kwuru maka ụdị ihe dị otu a?

Ngalaba 31 na 33 nke iwu na-achịkọta ntuliaka na Naịjirịa

Ebe foto si, Electoral Act 2022

Nkọwa foto, Ngalaba 31 na 33 nke iwu na-achịkọta ntuliaka na Naịjirịa

Ngalaba 31 nke iwu na-achịkọta ntuliaka, a kpọrọ Electoral Act 2022', kwuru na naanị ụzọ abụọ ka e nwere ike iji gbanwee aha onye ahọpụtara maka ịzọ ọkwa ọchịchị.

Nke mbụ bụ ma ọ bụrụ na onye ahụ ewere aka ya wepụ onwe ya n'ịzọ ya bụ ọkwa; nke abụọ bụ ma onye ahụ nwụọ.

Ọ bụrụ na ihe dị otu a mee, pati ga-edegara Inec akwụkwọ ma wegara ha aha onye ha ga-eji dochie.

A ga-emerịrị nke a ihe dịka ụbọchi iri itoolu (90 days) tupu ụbọchi ntuliaka.

Usoro Inec wepụtara maka ntuliaka 2023

Ebe foto si, INEC

Nkọwa foto, Usoro Inec wepụtara maka ntuliaka 2023

N'usoro ntuliaka nke afọ 2023, INEC kwuru na ndị pati dị icheiche nwere ohere ịgbanwe aha ndị ha tinyere ruo ụbọchị 15 nke ọnwa Julaị.

Ọ gafee ụbọchị a, aha nke ha zigabuuru Inec bụ nke Inec ga-ewere.