'Aga m enweta nnwereonwe m' - Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi otu Indigenous People of Biafra, Ipob n'aha ịchafụ ekwuola okwu mbụ banyere mkpebi ụlọikpe kachasị nyere maka ọnọdụ ya.
Na mkpebi Ụlọikpe Kachasị, ọkaikpe mmadụ ise ahụ kachapụrụ mkpebi ụlọikpe etiti ma kwuo na Kanu ga-azarịrị ọnụ ya maka ebubo niile e boro ya nke gụnyere 'treason', iyi ndụ egwu wdgz.
Na nzaghachi,, Kanu kwuru na agbanyeghi mkpebi ụlọikpe kachasị, 'aga m enweta nnwereonwe m'.
Nnamdi Kanu nọ n'ụlọ mkpọrọ kamgbe afọ 2021 bụ oge gọọmentị Naịjirịa jidere ma nwụchie ya na mba Kenya kpọlata ya na Naịjirịa.
Ụlọikpe etiti na nke mkpekwa ekpebibuola ka a tọghapụ Nnamdị Kanu ma hapụ ya ka ọ laa na belu, a kachapụkwara ebubo niile ndị e boro ya maka na ha kwuru na usoro Naịjirịa siri kpọlata ya megidere iwu.
Mana ndị ọkaiwu Naịjirịa rịọrọ mkpekwa n'aka ụloikpe kachasị banyere mkpebi ndị ahụ. Ụlọikpe kachasị bụ Supreme Court n'aka nke ha nyekwara mkpebi ha n'abalị 25 ọnwa Disemba afọ 2023.
Kanu nabatara mkpebi ahụ ọ ka na-enyocha enyocha ma kwuo na mkpebi ahụ agaghị agbari ya mmụọ.
N'akwụkwọ ozi ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor zipụtara ka ọ gaachara zute Kanu n'izu a, Ejiofor kwuru na ya na ọkaiwu Mike Ozekhome SAN kọwaara Kanu ihe niile ha nyochapụtara n'ime mkpebi ụlọikpe kachasị.
Ejiofor kwuru na; "Onyendu jiri ohere a na-echetara Ụmụchineke na ọnọdụ ọbụla ọ na-agabiga anaghị amaja ya maka na ọ ga-enweta mmeri na ngwụcha".

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor Facebook
Ihe niile ụlọikpe kachasị kpebiri
Ikpe Nnamdi Kanu ga-aga n'ihu - Cheta na ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu rịọrọ ụlọikpe ka a kachapụ ikpe Nnamdi Kanu maka na ụzọ e siri nwụchie ya ma kpọlata ya na Naịjirịa n'afọ 2021 bụ nwuchi nke na-abụghị ụzọ ziri ezi. Ụloikpe mkpekwa kwetara ekpere ahụ ma kpebie na etu e siri kpọlata ya ezighizi ezi nke mere na o kwesighi ka e kpe ya ikpe cha cha. Mana ụlọikpe kachasị ekwetaghị nan nke ah, ha kwuru n'ezie na ụzọ e siri kpọlata ya abụghị nke ezigbo mana ọ pụtaghị na a gaghị ekpezi ya ikpe ihe o mere. Ha kwuru na Naịjirịa erubeghi ogogo dị etu ahụ.
Ụlọikpe mkpekwa egosighi ikpe ọbụla gosiri na onye anwụchiri n'ụzọ ezighi ezi agaghị aga ikpe.
Naịjirịa gbaa mbọ na-eme ihe n'ụzọ ziri ezi.
Ikpe Nnamdị Kanu ga-aga n'ihu n'ụlọikpe High Court




























