Etu enyi abụọ si nwụọ na Nkpor, Anambra Steeti oge ndị ntọ wakporo ha

Akụkọ kwuru na aha e ji mara enyi atọ ahụ bụ Obyno, Megabyte na Eriri Ego.

Ebe foto si, Maria Nwachi Ude/Facebook

Nkọwa foto, Akụkọ kwuru na aha e ji mara enyi atọ ahụ bụ Obyno, Megabyte na Eriri Ego.
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Njiji a jiri n'akwa ụzọ dị na Nkpor Anambra steeti oge ndị ntọ wakporo ndị enyi atọ n'eme njem nke butere ọnwụ abụọ n'ime ha.

Akụkọ kwuru na aha e ji mara enyi atọ ahụ bụ Obyno, Megabyte na Eriri Ego.

Ọ bụ oge ha si Enugwu steeti eme njem aga Anambra ka ndị omekome ahụ wakporo ụgbọala ha.

Oge nke a mere, ndị enyi ahụ chọpụtara na ọ bụ ndị ntọ ka ndị ahụ wakporo ha bụ.

N'iji zọọ ndụ ha, Obyno na Eriri Ego gbapụrụ ọsọ wee si n'akwa ụzọ ahụ mapụ. Mana ha ji isi daa ma nwụọ, maka na akwa ahụ dị oke elu.

Oge nke a mere, ndị omekome ahụ gara n'ihu tọrọ Megabyte onye nọ n'ụgbọala ya na ama jijiji.

Ha tọọrọ ya ma hapụ ụgbọala ya n'ebe ahụ.

Ihe ndị uweojii kwuru

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga

Ebe foto si, Anambra State Police Command

Nkọwa foto, Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga

Ka ọ dị ugbua, enweghị onye ma ọnọdụ nwamadị ahụ maka na ndị omekome ahụ tọọrọ ya akpọtụrubeghị ezinaụlọ ya maọbụ kwuo ihe ha ji tọrọ ya.

Oge anyị kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikengaiji nweta ọnụ mmiri okwu ya, o kwuru na ndị uweojii steeti ahụ amaghị maka ọdachi ahụ.

Akụkọ a bụ otu n'ime ọtụtụ akụkọ banyere ajọ agwa ndị ntọ na-akpa n'Anambra steeti.

Cheta na n'ọnwa Disemba 2024, ndị omekome tọrọ onyeomeiwu Anambra steeti bụ Justice Azuka ma gbuo ya. Oge a nwụchiri ndị kpara nkata ahụ , ha gosiri ndị uweojii ebe ha dọbara ozu onyeomeiwu ahụ ha gburu.