Ikpe ọnwụ amaala Uduak Akpan maka igbu Iniubong Umoren

Mgbe e biputara ya

Ọkaikpe Bassey Nkanang n'ụloikpe elu dị n'Akwa Ibom atụọla Uduak Akpanm ikpe ọnwụ maka ogbugbu Iniubong Umoren.

Cheta na Umoren bụ nwata nwaanyị gụchara mahadum na-achọ ọrụ were danya n'aka Uduak Akpan bụ onye gburu ya.

Lee etu ya bụ okwu siri bido

★ N'ụbọchị 29/04/2021 ka Umoh Uduak kwuru sị na enyi ya nwaanyị bụ Happiness Iniobong Umoren gara nwale ajụjụ ọnụ maka ọrụ kama na ọ nọ na nsogbu.

★Ya bụ okwu bidoro na-ewu na soshal Midia nke eji akara #FindHinyHumoren ekesa. Ndị uweojii pụtara kwuo na ọ nwụọla.

★Ndị uweoji kwuru n'ụbọchị 02/05/2022 na ha eburula ozu Ini gawa ụlọọgwụ Mahadum Uyo maka nyocha. Ha kwukwara na ọ bụ n'ili na emighị emi kaha hụtara ozu ya.

★N'otu ụbọchị 02/05/2022 ka ndị uweojii nwuchiri Uduak Akpan.

★Eliri Umoren n'obodo ya bụ Nung Ita, Ikot Essien nke dị n'okpuruọchịchị Oruk Anam, Akwa Ibom Steeti n'ụbọchị 14/05/2021.

★N'otu ụbọchị 14/05/2021 ka ndị uweojii kpopụtara Uduak Akpan onye kwuru na oji ọrụ were rabata Umoren ma gbuo ya mgbe ha nwere nghọtahe.

★Akpụpụrụ Akpan na nna ya bụ Fran ụlọikpe n'ụbọchị 26/07/2021 ebe o kwuru na ọ bụ ya gburu Umoren kama o kwuru na ọwakp;oghị ya n'ike.

★ Kama n'ụbọchị 05/11/2021, Akpan kwuharịrị ihe o kwuru na mbụ were sị na akagidere ya anya mere o jiri kwuo ihe o kwuru na mbụ.

★Dịka a na-ekpe ya ikpe n'ụbọchị 13/04/2022 ka nna Akpan kwuru na nwa ya nwoke nwere ọrịa ụbụrụ nke a na-akpọ schizophernia. nke a bụ ọrịa ụbụrụ na-eme na mmadụ amaghị nke bụ nke.

★Ụlọikpe elu nke dị n'Uyo n'ụbọchị 21/06/2022 kwuru na ọ bụ n'ụbọchị 04/08/2022 ka a ga-ekpe ikpe ikpeazụ maka ọnwụ Umoren.