You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ikpe ọnwụ amaala Uduak Akpan maka igbu Iniubong Umoren
Ọkaikpe Bassey Nkanang n'ụloikpe elu dị n'Akwa Ibom atụọla Uduak Akpanm ikpe ọnwụ maka ogbugbu Iniubong Umoren.
Cheta na Umoren bụ nwata nwaanyị gụchara mahadum na-achọ ọrụ were danya n'aka Uduak Akpan bụ onye gburu ya.
Lee etu ya bụ okwu siri bido
★ N'ụbọchị 29/04/2021 ka Umoh Uduak kwuru sị na enyi ya nwaanyị bụ Happiness Iniobong Umoren gara nwale ajụjụ ọnụ maka ọrụ kama na ọ nọ na nsogbu.
★Ya bụ okwu bidoro na-ewu na soshal Midia nke eji akara #FindHinyHumoren ekesa. Ndị uweojii pụtara kwuo na ọ nwụọla.
★Ndị uweoji kwuru n'ụbọchị 02/05/2022 na ha eburula ozu Ini gawa ụlọọgwụ Mahadum Uyo maka nyocha. Ha kwukwara na ọ bụ n'ili na emighị emi kaha hụtara ozu ya.
★N'otu ụbọchị 02/05/2022 ka ndị uweojii nwuchiri Uduak Akpan.
★Eliri Umoren n'obodo ya bụ Nung Ita, Ikot Essien nke dị n'okpuruọchịchị Oruk Anam, Akwa Ibom Steeti n'ụbọchị 14/05/2021.
★N'otu ụbọchị 14/05/2021 ka ndị uweojii kpopụtara Uduak Akpan onye kwuru na oji ọrụ were rabata Umoren ma gbuo ya mgbe ha nwere nghọtahe.
★Akpụpụrụ Akpan na nna ya bụ Fran ụlọikpe n'ụbọchị 26/07/2021 ebe o kwuru na ọ bụ ya gburu Umoren kama o kwuru na ọwakp;oghị ya n'ike.
★ Kama n'ụbọchị 05/11/2021, Akpan kwuharịrị ihe o kwuru na mbụ were sị na akagidere ya anya mere o jiri kwuo ihe o kwuru na mbụ.
★Dịka a na-ekpe ya ikpe n'ụbọchị 13/04/2022 ka nna Akpan kwuru na nwa ya nwoke nwere ọrịa ụbụrụ nke a na-akpọ schizophernia. nke a bụ ọrịa ụbụrụ na-eme na mmadụ amaghị nke bụ nke.
★Ụlọikpe elu nke dị n'Uyo n'ụbọchị 21/06/2022 kwuru na ọ bụ n'ụbọchị 04/08/2022 ka a ga-ekpe ikpe ikpeazụ maka ọnwụ Umoren.