Ihe anyị ma maka ndị ntorobịa a tọrọla n'Isu

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wụchiri obodo Ekwe dị n'okpuruọchịchị Isu dị n'Imo steeti n'ụbọchị Satọde, Juun 11, 2022, ma nwụrụ ihe ruru ụmụokorobịa 15 dịka akụkọ si kwuo.
Ndị hụrụ ka ihe mere kwuru na ndị omekome ahụ kpuchiri ihu ha gbaliri egbe elu iji tinye ndị mmadụ ụjọ n'ahụ, tupu ha atọrọ ụmụokorobịa ahụ ha hụrụ ebe ha na-egwu aja na mmiri Njaba.
Ha kwuru na ndị ojiegbe ahụ si na mmiri Njaba kewara etiti obodo Ekwe na Amucha dị n'okpuruọchịchị Njaba, bata obodo ahụ bịa tọrọ ụmụokorobia a.
Princewill Akubuo bụ otu onye obodo Ekwe, gwara onye ntaakụkọ BBC n'ekwentị na egbe ahụ ndị ojiegbe ahụ gbalichara egbe elu, chụbara ndị ntorobịa na ndị obodo hụrụ ha n'ime ọhịa ebe ha nọ zoo ruo mgbe ha pụrụ.
O kwuru na ndị ojiegbe ahụ mechara gaa n'ụlọ eze obodo ahụ bụ Eze Nicholas Ibekwe, sị ndị mmadụ makpuru n'ala, gbalie egbe elu, tupu ha apụọ.
Eze Ibekwe gwara onye ntaakụkọ BBC na ndị ojiegbe ahụ bịara n'ụlọ ya n'ezie.
O kwuru na mmadụ anọ n'ime ndị ojiegbe ahụ ekpuchighi ihu ha.

Michael Abattam bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru mgbe a kpọtụrụ ya, na enwebeghi mkpesa ndị uweojii natarala banyere ya bụ ihe mere.





























