Ihe ọchịchị m mepụtarala n'ime ụbọchị 100 gara aga - Gọvanọ Soludo

Charles Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Charles Chukwuma Soludo

Mgbe e biputara ya

O meela ụbọchị otu narị kamgbe Chukwuma Soludo na Onyeka Ibezim malitere ọrụ dịka Gọvanọ na Osote gọvanọ n'Anambra Steeti.

Ọ bụ n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Maachị afọ 2022, ka e duru Soludo na Ibezim n'iyi ọrụ.

"Anyị rụrụ ihe karịrị awa asatọ n'ụbọchị ahụ e duru anyị n'iyi ọrụ, nke gosiri na anyị dị njikere maka ọrụ a," Soludo kwuru.

O kwuru nke a taa bụ Satọde, Jun 25, dịka ọ na-akọwara ndị Anambra ihe ọchịchị ya meputarala, nakwa ihe ndị cheere ha aka mgba.

Lee ụfọdụ ihe Soludo mepụtarala

Charles Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Charles Chukwuma Soludo

  • Imeghari atụmatụ mkpata na mmefu ego nke afọ 2022 bụ nke Gọvanọ Willie Obiano meburu tupu ọ pụọ n'ọchịchị
  • Ịgbaso usoro ghe anya oghe n'ịhọpụta ndị Kọmishọna ya, nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ntorobịa
  • Ihazi ọgbakọ ọzụzụ pụrụ iche maka ndị Kọmishọna na ndị isi ọrụ gọọmentị dị icheiche iji mee ka onye ọbụla n'ime ha mara ihe ọ na-eme
Charles Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Charles Chukwuma Soludo

  • Ikpocha ahịhịa ma mepee nnukwu ọwa mmiri dị na Fegge nakwa Okpoko, na mpaghara Ọnịcha, iji gbochie ọdachi ide mmiri.
  • Ịkwụsị ọrụ ndị agboro na ndị mpịawa azụ n'ahịa nakwa okporoụzọ dị icheiche n'Anambra Steeti
  • Ịtọ ntọala nke ụlọahịa ọgbara ọhụrụ ebe a ga na-ere ọgwụ dịka iwu si kwado, n'Oba
Charles Chukwuma Soludo

Ebe foto si, @AnambraGovt/Twitter

  • Ịrụ okporoụzọ si Amasea gawa Ugwuoba
  • Ịmalite atụmatụ pụrụ iche iji wulite ọrụ ubi na nkọpụta ihe oriri n'Anambra steeti
  • Ihibe atụmatụ ịkụ osisi akị oyibo ruru otu nde kwa afọ, iji wulite ohere Anambra steeti nwere isi ịmụba akụnụba ya site n'ọrụ ubi
  • Ihibe atụmatụ ọ kpọrọ "adopt a school initiative", bụ nke o ji akpọ ndị ọgaranya Anambra ka ha họrọ ụlọakwụkwọ ọbụla dị ha mma, mezie ya ma wulite ya, n'ụzọ iji nyere gọọmentị aka n'ọrụ mwulite agụmakwụkwọ.

Atụmatụ Soludo tinyere iji belata enweghị nchekwa n'Anambra

Charles Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Charles Chukwuma Soludo

  • Inye mgbaghara pụrụ iche (bekee na-akpọ 'amnesty') maka onye ekperima ọbụla ga-apụta rịọ mgbaghara ma kwụsị iyi ndụ egwu
  • Iwepụta akara ekwentị pụrụ iche nke ndị mmadụ ga-akpọ maka enyemaka - Akara ekwentị abụọ a bụ: 07039896429 na 09017280990
  • Iwepụta atụmatụ ịkwụ ụgwọ maka ndị ga-agbara gọọmentị ama iji nwuchie maọbụ gbochie ndị ekperima
  • Ịga leta Nnamdi Kanu na mkpọrọ iji mee ka iwe dajụọ n'obi ndị nkwado ya
  • Ihi kọmiti udo nke gụnyere ndị eze ọdịnala, ndị isi ụka, ndị ọchịchị obodo, na ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na steeti ahụ
  • Ịhazi ekpere pụrụ iche n'ụlọụka dị icheiche ka udo wee chịa
  • Ịnabata otu jikọrọ ndị okpukperechi Islam bi n'Anambra ebe ha nọrọ nwee ọgbakọ maka mwulite nchekwa nakwa ịdịkọnotu

Ihe ndị cherela Soludo aka mgba kamgbe ọ malitere ọchịchị

Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Charles Chukwuma Soludo

Nkọwa foto, Ndị ekperima emebiela ọtụtụ ụlọ gọọmentị kamgbe Soludo malitere ọchịchị

N'okwu Soludo kwuru iji cheta ụbọchị otu narị ọ rụrụla ọrụ dịka gọvanọ, o kwuru na ihe abụọ bụụrụ ya nnukwu ọgbatauhie bụ:

  • Ọnọdụ akụnụba Anambra oge o weere ọchịchị; na
  • Ọnọdụ nchekwa ọjọọ

Soludo kwuru na akpa Anambra steeti tọgbọ chakoo oge ọ batara, dịka o si sụọ ya na bekee, ọ kpọrọ ya "red treasury".

O kwukwara na ụgwọ 'gratuity' gọọmentị Anambra ji ndị lara ezumike nka tupu ọ bata n'ọkwa ruru nde naịra iri abụọ, n'ihi na akwụbeghị ha ụgwọ kamgbe afọ 2018.

N'aka nke ọzọ, ọnọdụ enweghị nchekwa gbagoro nnọọ elu dịka Soludo malitechara ọchịchị.

Ndị omekome awakpola ụlọ gọọmentị dị icheiche, tinyere isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị Aguata, nke bụ mpaghara Soludo si pụta.

Ndị ekperima tọọrọ ma gbuo Okechukwu Okoye, bụ onye na-anọchite mpaghara Aguata 2, n'ụlọ omeiwu Anambra steei.

Aguata 2 bụ kpọmkwem ebe Isuochi, bụ obodo Soludo, dị.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ọchịchị Soludo na soshal midia

Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ọnọdụ nchekwa ọjọọ ekwebeghị Soludo ṅụrụ mmiri tọgbọ iko kamgbe ọ malitere ọchịchị.

Mana ụfọdụ ndị ọzọ na-ekwu na afọ ejughị ha n'ihe ya bụ gọvanọ rụrụla, n'ihi na ha tụrụ anya karịa etu.

Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ ndị mmadụ na-ekwu maka ya bụ na unyi ejupụtala akụkụ dị icheiche n'obodo ndị mepere emepe n'Anambra.

Lee ụfọdụ ihe ha na-ekwu na sosha media:

Soludo 100 Days

Ebe foto si, Twitter/Screengrab

Soludo 100 Days

Ebe foto si, Twitter/Screengrab

Soludo 100 days

Ebe foto si, Twitter/Screengrab

Soludo 100 days

Ebe foto si, Twitter/Screengrab