Godwin Emefiele sị na aka ya dị ọcha, EFCC akpọchie ya ọzọ

Mgbe e biputara ya

Onye bụbụ onyeisi ụlọakụ ukwu Naịjirịa bụ Central Bank of Nigeria, CBN ekwuola na aka ya dị ọcha n'ebubo 21 n'ime ebubo 26 ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission, EFCC boro ya.

EFCC kpụgara Emefiele ụlọikpe ma ebubo na ikpe iji ikike ụlọọrụ ya mee ihe ndị na-adịghị n'ikike ya na inye ndị mmadụ ego ruru ijeri kwuru ijeri dọla.

Emefiele gara ụlọikpe ụbọchị Mọnde n'ihu ọkaikpe Jọstis Rahman Oshodi n'ụlọikpe dị n'Ikeja.

A kpụpụtara Emefiele na onye ọzọ a na-enyo enyo bụ Henry Omole.

A na-ekpekwa ya ikpe n'ebubo na o jiri ikike ụlọọrụ ya mee ihe ndị ọ na-ekwesighi ime malite n'afọ 2022 ruo 2023.

Gịnị bụ ụfọdụ ebubo ndị a na-ebo Emefiele?

Dịka ọkaiwu ndị EFCC bụ Rotimi Oyedepo (SAN) siri kwuo, Emefiele "nyefere ego ruru $2.1ijeri na e nyeghi ohere ka ndị ọzọ binye aka na ya, agwa bụ ihe megidere iwu Naịjirịa."

Otu n'ime ebubo a na-ebo ya bụ na o nyere "ego $291,945,785.59 na-enyeghi ohere ka ndị ọzọ ego ahụ dị mkpa binye aka na ya."

N'ebubo ọzọ yikwara nke ahụ, e kwuru na o nyekwara ego $1.769,254,793.16 nakwa $370,872,893.01 na-enyeghi ohere ndị ọzọ ọ dị mkpa ibinye aka".

O kwukwara na Emefiele na onye nke ọzọ a na-ekpe ya dara iwu nke gụnyere ịnata onyinye $110,000 n'aka otu onye nnọchitenanya n'aha Emefiele maka na Emefiele nye ya ego dọla.

EFCC kwuru na ebubo niile a na-ebo Emefiele na ihe niile a na-ebo ya megidere iwu Naịjirịa nke dị n'akwụkwọ iwu Section 73 iwu 2011 megidere mpụ nke Legọs Steeti.

E nyeghi Emefiele belu

Emefiele na onye a na-ekpe ya na ya ikpe kwuru na aka ha dị ọcha mana ọkaikpe jụrụ ịtọghapụ ha na belu dịka ha siri kpee n'ekpere.

Ọkaiwu Emefiele bụ Abdulakeem Labi-Lawal rịọrọ ụlọikpe ka a tọghapụ ya na belu rụọ oge a ga-ekpebi ikpe ya na ụlọikpe ekweghi.

Labi-Lawal kwuru ka ụlọikpe mee amara n'ihi na onye ọ na-anọchite na-erubere ụlọikpe isi na-abịa ụlọikpe ụbọchị ọbụla e binyere ikpe mana ọkaikpe ahụ ekweghi atọghapụ ya, kama o bugharịrị ụbọchị ige ikpe ya gaa abalị 11 ọnwa Epurel afọ 2024.