Jim Iyke ọ banyela okpukperechi Alakụba? – Lee nke bụ eziokwu

Mgbe e biputara ya

Akụkọ na-efegharị na soshal midia ugbua bụ na onye ejije Nollywood a ma ama bụ Jim Iyke abụrụla onye okpukperechi Alakụba.

Nke a na-abịa dịka foto so akụkọ a gosiri ebe Jim Iyke yi ejiji dị ka nke ndị okpukperechi Alakụba ma jiri ọla ekpere ha bụ ‘Tasbih’ n’aka.

Ọtụtụ ndị na-ekesa akụkọ a na soshal midia na-ekwu na ọ bụ onyeisi ndị ụka Alakụba n'Imo steeti bụ Sulaiman Yusuf Njoku bụ onye gbara ama akụkọ a.

Ha sịkwara na ọ bụ ya dubanyere ya n'ụzọ ite mmanụ n'isi nke mbụ n’okpukperechi ahụ.

Jim Iyke ọ banyere okpukperechi a n'ezie?

Njoku bụ onyeisi okpukperechi a n'Imo Steetị gwara BBC Igbo na akụkọ a abụghị eziokwu.

O kwuru: “Nke bụ eziokwu bụ na Jim Iyke bịara hụụ anyị na ngwụcha ọnwa Mee afọ 2022”

“E nwere onye ezinaụlọ anyị nwụrụ nke ọ bịara njem nleta ịhụ anyị”

“Akụkọ a nke ndị mmadụ na-akpọ aha m na ya abụghị eziokwu dịka o teela Jim Iyke na-ekesa foto a, nke a bụ tupu ọ bịa ya bụ njem nleta”

Kedụ ihe Jim Iyke kwuru?

I ji saa akụkọ a, Jim Iyke zipụtara ihe onyonyo ọhụrụ n’akara Instagram ya ma kwuo na o nweghi mgbe o ji wụbanye n’okpukperechi Alakụba.

Iyke kwuru “E nwere ihe a naghị eji egwu egwu”

“E mere ejije n’ọnwa gara aga na mba Ghana nke ga-apụta na nso nso a”

“Ejije ahụ bụ maka ndi Alakụba ọ bụ mgbe ahụ ka e sere foto a, ọ bụ etu a ka ndị akụkọ ụgha siri malite ikesa akụkọ a”

“Ana m akwenyere okpukperechi niile ugwu mana enweghị m atụmatụ ọbụla ibanye ofufe Alakụba”

Ụfọdụ na soshal midia na-ekwu na Jim Iyke ji aka ya ekesa akụkọ a n’ụzọ agụghọ iji ree ahịa ejije ọhụrụ ya.

Ndị kwuru nke a na-arụ aka n’ihe Jim Iyke na Uche Maduagwu mere n’oge gara aga mgbe ha tụrụ asị n’okwu Jim Iyke iti ya ihe.

Akụkọ a wuru ewu ebe Jim Iyke gwara BBC Igbo n’oge ahụ na ya bụ akụkụ iti ihe bụ eziokwu.

Dịka ọnwa ole na ole garachara, Jim Iyke pụtara kọwaa na ya bụ akụkọ bụ ụgha.

O kwuru na ya na Maduagwu kpara ya akpa ka e sete ha abụọ ebe ọ dị ka ọ na-eti ya ihe iji ree ahịa ejije ọhụrụ.

Ejije a bụ maka ndị na-akatọ ndị mmadụ na soshal midia nakwa etu ha nwereike isi dabanye na nsogbu.

Ihe mere okwu okpukperechi Jim Iyke ji sara ọkụ

Dịka Naịjirịa dị, e nwere okpukperechi atọ kacha ewu ewu, abụọ n’ime bụ nke ọkankụ ndị Naịjirịa na-esonye – Okpukperechi Kraịsti na okpukperechi Alakụba. Nke atọ bụ okpukperechi nke omenala.

Ndị nọ na ndịda Naịjirịa na-aka esonye okpukperechi Kraịsti ebe ndị nọ n’ugwu Naịjriịa na-aka esonye okpukperechi alakụba.

Jim Iyke dịka onye si Anambra steeti nke ọwụwa anyanwụ Naịjirịa egosila ugboro ugboro na ọ bụ onye okpukperechi Kraịstị nke otu n’ime aka ebe gosiri nke a bụ ihe onyonyo pụtara ihe mgbe ọ gara ụka Kraịsti a ma ama bụ ụka Synagogue nke TB Joshua larala mmụọ nọ n’isi ya gaa nata ekpere.

Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ ihe ịtụ n’anya ma ahụ onye ndịda Naịjirịa isonye okpukperechi alakụba ebe ọ na-abụkwa ihe ịtụ n’anya ma ahụ onye mpaghara ugwu Naịjirịa sonye okpukperechi Kraịsti.

Nke mere akụkọ okpukperechi Jim Iyke ji sara ọkụ ọkachasị dịka ọ bụ onye a ma ama.