You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu nwoke si tapụ nwunye ya anya n'ihi afọ ime n'Enugwu
Otu nwaanyị bụ Onyinye Ozokolo nọ na nnukwu ahụ ụfụ ugbua n'ihi ihe ọ gabigara n'aka di ya.
Dịka Onyinye si gwa BBC, di ya tapụrụ ya anya n'ihi na ọ na-amụrụ ya ọtụtụ ụmụ nke ya bụ di ya enweghi ike ịzụ.
Nwoke ahụ aha ya bụ Ndubueze Ozokola na nwunye ya mụrụ ụmụ isii ebe ha bi n'Enugwu.
Onyinye sị "Di m na-eti mụ na ụmụaka isii mụ ihe kwa mgbe kwa mgbe n'agbanyeghi na o nweghi ihe anyị mere".
O kwuru na ọ tapụrụ ya anya mgbe ọ gara igbo ọgụ n'etiti nwa ya nwaanyị na di ya maka na di ya weliri mma.
Di ya mechara sị ya laa be nna ya maka otu okwu ahụ ịmụ ọtụtụ nwa.
Onyinye gara kpee di ya n'aka ndị uweojii steeti ahụ bụ ndị nwụchiri ya ma mechaa tọghapụ ya.
Ka ọ dị ugbua otu na-azọ ikike ruru mmadụ bụ Women and Child justice initiative bụ ndị na-enyere Onyinye aka.
Onyeisi otu ahụ bụ Nneamaka Ilodigwe kwuru na ọ gara n'ụlọọrụ ndị uweojii ịjụ nwoke ahụ ajụjụ ọnụ ka ọ kọwara na ọ bụ n'okwu ịmụ nwa ka ha ji ese okwu
Ilodigwe kwuru na nwoke ahụ gwara nwunye ya mgbe ha mụchara ụmụaka nke atọ ka ha kwụsịzie mana mgbe ọbụla o dinara nwunye ya, nwaanyị ahụ a dị ime.
Mana ụlọọrụ ahụ na-agba mbọ ịnwụchigharị nwoke ahụ ndị uweojii tọghapụburu.
Onyinye ka nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ n'ihe ahụ mere ugbua.