You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Otu n'ime ndị ohi a gbara ọkụ n'Enugwu bụbu onye uweojii - Ahmed Ammani
Obodo Enugwu mara jijiji ụbọchị wenezde dịka ndị mmadụ gbara umu nwoke abụọ ọkụ n'ụzọ Bisala.
Ya bụ njinji jiri oge ụmụ nwoke abụọ nọ n'ime ọgbatumtum keke ji egbe nara otu nwa agbọghọ na eme POS ego oji arụ ọrụ.
Ngwa ngwa ha mere nkea, nwaada ahụ tiri mkpu, ọtụtụ ndị ụgbọala mkpataego mini bus na keke chụwara ha ọsọ wee nwudo ha na Pascal Jake roundabout dị n'ụzọ Bisala road Enugwu.
Ọ bụzị ebe ahụ ka igwe mmadụ ahụ gbakọrọ tiri ha ihe ma munye ha ọkụ. Dika otu onye mini bus hụrụ ebe ịhe mere gwara BBC "amara m nke ahụ dị ọcha n'ime ha, ọ bụ onye uweojii na New haven police station, ọ na akwụ na checkpoint anakọrọ anyị ego".
Oge anyị rutere ebe ahụ ụmụ nwoke abụọ ahụ erechala ọkụ, ndị uwe ojii bịa buru ozu ha.
Kọmishiona Uweojii n'Enugwu bụ Ahmed Ahmani kwetara na ọ bụ eziokwu na otu n’ime mmadụ abụọ ahụ agbara ọkụ bụbu onye uweojii were kwuo na achụbuọla ya n'ọrụ n'ihi ajọ akparamagwa.
CP Ahmani nyere iwu ka ndị otu nyocha uweojii akpọrọ State Criminal Intelligence and Investigation Department (SCIID) jee mee ezigbo nchọpụta ihe kpatara ihe ọdachị ahụ.
Ndị uweojii kwukwara na ndị niile aka ha dị na ịgba ụmụnwoke abụọ ahụ ọkụ dara iwu megidere "Jungle Justice Act 2015, the amended police act 2020 and other Laws” wee kwee nkwa na-aga anwụchi ha niile.