Ihe anyị ma gbasara nwaafọ Naịjirịa ọzọ e gburu na Saụt Afrịka

Aha onyonyo, Ihe anyị ma gbasara nwaafọ Naịjirịa ọzọ e gburu na Saụt Afrịka
Ihe anyị ma gbasara nwaafọ Naịjirịa ọzọ e gburu na Saụt Afrịka
Mgbe e biputara ya

Ibeh Chika Simon abụrụla nwaafọ Naịjirịa ọzọ e gburu na mba Saụt Afrịka. Nke ugbua mere oge ndị uweojii gara ọrụ Bellville dị na mpaghara Cape Town n'ụbọchị 23 July 2026.

Ihe onyonyoo na-efegharị na soshal midịa gosiri oge ndị e chere na ha bụ ndị uweojii mba Saụt Afrịka na-eti ya ihe ma na-emekpa ya ahụ.

E mechakwara hụụ ka ozu ya tọgbọrọ n'ala, dịka ụfọdụ mmadụ gbara ya okirikiri. Ka e mechara e tinyere ozu ya n'akwa ọcha ma bunye ya n'ime ụgbọala gbatagbata.

N'ozi ha wepụtara n'ụbọchị 25 Julaị 2026, Ụlọnnọchiteanya Naịjirịa na Johannesburg jiiri olu ike katọọ ya, ma kọwaa ọnọdụ butere ọnwụ Chika dịka nke a na-enyo enyo.

Ozi ahụ kwuru na ọnọdụ a gosiri na o nweghị ihe e ji ndụ mmadụ kpọrọ na mba Saụt Afrịka, n'agbanyeghị na iwu mba ahụ kwadoro ikike mmadụ nwere ịdị ndụ. Ha kpọrọ oku ka ndị ọchịchị Saụt Afrịka mee ezigbo nnyocha miri emi gbasara ọdachi ahụ.

Oge anyị kpọrọ Onyeisi Ọhanaeze Ndịigbo na mba Saụt Afrịka bụ ABC Okoko n'ekwentị, o jiri obi mwute kwuo na ihe a abụghị oge mbụ maọbụ nke abụọ ụdịrị ihe a na-eme.

Okoko kwuru na ha achọghịzi ịnụ gbasara nkatọ Gọọmenti Naịjirịa na-akatọ omume ọjọọ ndị a oge niile, kama ihe ha chọrọ bụ ka gọọmenti mee ihe gbara ọkpụrụkpụ iji gwa gọọmenti mba Saụt Afrịka na o zuola.

Ọ sịrị na ha agbaala mbọ ọtụtụ oge iwepụ okwu ndị dị etu a n'ụlọikpe, mana o nweghị mkpụrụ ọbụla ọ mịtara, n'ihi na ụlọikpe na-eji otu ụzọ maọbụ ọzọ kagbuo mkpesa ha.

Ọnọdụ a na-abịa dịka ọ gachara izuụka atọ e gburu ụmụafọ Naịjirịa abụọ bụ Emeka Iroegbu na Musa Joe na mba Saụt Afrịka.

Oge ahụ, Mịnịstrị Naịjirịa na-ahụ maka mmekọrịta mba ofesi wepụtara ozi iji katọọ ya.

Ha gosikwara mwute gbasara mwakpo mba Saụt Afrịka na-emekarị ndị Naịjirịa nakwa ndị mbịarambịa bi na mba ha, ma dọo aka na ntị na ọnọdụ ahụ nwereike ime ka mmekọrịta dị n'etiti Naịjirịa na Saụt Afrịka gbaa ụka.

Ka ọ dị Minista na-ahụ maka ikpe ziri ezi na mba Saụt Afrịka bụ Mmamoloko Kubayi kwuru na ụfọdụ ndị mbịarambịa gbara isi akwara ma gbochie ndị uweojii oge ha gara ọrụ na mpaghara Bellville, mana o kwuru na a malitela ime nnyocha gbasara ọnọdụ ahụ.