Ụgbọala m egbughị mmadụ atọ ọbụla n'Abakaliki - Gọv Dave Umahi

Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi

Ebe foto si, Dave Umahi

Mgbe e biputara ya

Ọ bụ eziokwu na ụgbọala "Convoy" Dave Umahi egbuola mmadu n aụzọ airort.

Aka na achị Ebonyị steeti bụ Engineer David Umahi agọchasịala ụkwụ na aka ya na ọ bụghị ụgbọ ala ya gburu mmadụ atọ n'ụzọ Airport Abakaliki.

Umahi kọwara ya bụ akụkọ gbara na soshal media niile dịka aka ọr ndị iro ya chọrọ ka ha nye ya an aha.

Umahi weputara ozu a site na aka onye ndụmọdụ ya na mgbasa ozu bụ Chuks Oko, were gwa ndị mmadụ ka ha ghara ige ntị n'asịri ndị iro ya asi makana ụgbọ all ya na ndị n'eso ya abịaghị nso ebe abụ ma ya foduzia ịgbu mmadụ.

Kepu kepu ahụ kwuru na ihe mberee nke okporo ụz ahụ mere na gburu mmadụ atọ bụ ndị ezza south LGA.

Ndị aka ebe kwuru na, Ọ bụzị Govano Umahi na chief Arthur Eze, onye gbapere flyover dị na Abaomege, Onitcha LGA bụzị oge ha na agbafee ka ha ji ụgbọala gbuo mmadụ atọ ahụ.

Ihe ndị uweojii kwuru maka ya bụ ihe

Anyị kpọkwara ọnụ na ekwuchitere uweojii Ebonyi steeti bụ SP Onome Onovwakpoyeya ọtụtụ oge na ekwe ntị ka ọgwa anyị ndị bụ ndị asi nwụrụnụ nakwa eziokwu dị n'ime ya, mana ọzaghị Ekwe ntị ya.ana ọzaghachiri ozi nke "text" ezigaara ya were kwuo "Enweghịm ihe ọbụla m ga-agwa unu. Kedụ ihe mere na ụnụ akpọghị ndị Road Safety"