'Onye kwụ ọtọ n'okọlọtọ Naịjirị abụghị nwa m' - Peter Obi

Peter Obi
Mgbe e biputara ya

Onye ji ọkọlọtọ Labour Party azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ Peter Obi azaala ebubu ndị mmadụ na-ebo ya sị na ọ bụ nwaanya nwoke bụ Oseloka Obi bụ onye yi afe Ipob kwu ọtọ n'ọkọlọtọ Nịajirịa.

Obi sị na ya bụ nwaamadị ahụ a na-ekwu maka ya abụghị nwa ya nwoke.

Ọ sị, " Nwa m nkwoke enweghị ụdị ohere ahụ".

O sị na ndị ahụ na-ebo ya bụ ebubo agaghị ewetali ihe akaebe ọbụla kwadoro ya bụ ihe ha na-ekwu.

O kwuru nke a na mkparịta ụka ya na ndị Arise TV n'ụtụtụ taa bụ Wenezde ebe ha gbara ya ajụjụ ọnụ dị icheiche.

Ọ sịkwa na nwaanya nwoke bi na UK mana onye mere ya bụ ihe abụghị n'UK ka ọ mere ya.

O kwuru na ụmụ ya na-ajụ ya ihe ọ ga-eme ka Naịjirịa dị mma, ka ndị niile bi n'ofesi chọrọ ịlọta nweeike lọta.

Ihe ndị ọzọ Peter Obi kwuru na mkparịtaụka ahụ

Ndị amaghị ndọrọndọrọ ọchịchị

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mgbe a jụrụ ya maka ihe Kwankwaso bụ onye ndụ ndị New Nigeria Peoples Party (NNPP) kwuru gbasara ịbụ Osote ya. Kwankwaso sị na ndị Igbo amaghị ndọrọndọrọ ọchịchị., na ọ ka Peter Obi mma ịbịa buru Osote ya karịa ịchọ ịnọ n'isi.

Peter Obi zara sị, " Ọ bụ ụdịrị echiche a mere Naịjirịa ka jiri nọrọ ebe ọ nọ taa. Ndị maara ndọrọndọrọ achịala Naịjirịa ọnweghị ihe ha chịtara, ka ahapụnụ ndị ha sị na ha amaghị ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha gbalịtụ."

Ọ sị na ndị mmadụ ekwesighịzị ịna eche ụdịrị echiche ahụ maka na ihe a chọrọ bụ onye ọchịchị doro anya, "ọbụghị onye si ukwu maobụ ndịda".

Ọ sị na nsogbu Naịjirịa hiwere isi n'amaghị achịkwa akụnaụba, na ya were ọchịchị, na ya ma ihe ya ga-eme.

Ọ sị na ya chọrọ ka atụọrọ ya vootu maka na ọ ga-egbo mkpa ndị mmadụ, ọ bụghị maka na ya bụ onye Igbo maọbụ onye obodo ọzọ.

Ihe o kwuru maka ndị nnupuisi

Mgbe a jụrụ ya ihe ọ ga-eme maka ndị agha nnupusis niile na-enye Naịjirịa nsogbu, Obi sị, "a ga m arịọ obula ka ha wetuo obi ala nabata gọomentị m. Na ya ga-emezi akụnaụba Naịjirịa otu ọ ga-esi bara onyeukwu na onye nta, mana ọ bụrụ na ya mechee ihe ndị a niile, na ya ga-achụpado niile ekweghị ekwe.

Ihe o kwuru maka Datti Baba-Ahmed

Mgbe a jụrụ Obi maka onye ga-abụ Osote ya, bụ nke na-enye Pati ya nsogbu ịchọta kemgbe, ọ sị na "anyị na ọtụtụ mmadụ akpaala maka ịchọta ezigbo mmadụ nwere ihe niile achọrọ ga-eso anyị rụọ ọrụ.

"Anyị na-achọ onye, gụrụ ezigbo akwụkwọ, ma ihe, bu ọdịmma Naịjirịa n'obi".

O kwuru na ha na Datti Baba-Ahmed bụ onye nwe Mahadum Base dị n'Abuja akpaala mana ha amabeghị ka ọ bụ ya ka ọ ga-adabara.

"Mana ya bụ nwaamdị nwere ihe anyị chọrọ, agbanyeghị na ha chọrọ onye ka ya bụrụ ntorobịa".

O kwuru na ya agaghị ekwu ma ọ ga-adabara Datti ugbua, mana ọha ga-amata onye ọ dabaara mgbe adịghị anya.

Mana o kwuru na ọ ga-amasị ya ma ha abụọ rụkọọ.

Ihe mere Peter Obi ji gaa Morocco, Egypt na-ebe ndị ọzọ

Peter Obi sị na ihe ya jiri mee njem na Moroko bụ ka ya mụta ihe. Ọ sị na "mba ahụ na-eme nke ọma".

Ọ sị na n'afọ gara aga, Moroko zụtara ihe nruru ijeri dọla iri ise n'afọ agara aga, ego ha retere na mmanụ agbidi esoghị na ya, ebe Naịjirịa retere ijeri dọla iri atọ n'otu afọ ahụ, agụnye ego ha retere na mmanụ agbidi.

Ọ sị na Ijipt mepụtara ihe ruru 3000 mgw ọkụ latrik. Ọ sị na ya "gara ịmụta ihe ha mere, ebe ha siri nweta ego ha jiri mee ya na ndị mere ya".