You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gunmen Attacks in Abatete: Etu e si gbuo nwa m nwoke ji ụmụ atọ
Otu nwaanyị n’Abatete bụ Helen Udo akwaala arịrị maka ogbugbu e gburu nwa ya nwoke bụ Uchenna Udo n’ụbọchị Mọnde 20 Juun, 2022.
Ọ sị na nke a bụ ụmụ ya ndị nwoke abụọ ga-anwụ n’ime otu ọnwa, otu dị afọ iri abụọ na ise ebe Uchenna dị afọ iri abụọ na anọ.
Helen sị na nke a mere n’ụbọchị Mọnde, mgbe nwa ya nwoke kwesịrị ịbịa leta ya mana ọ sị ya chere ruo na mgbede n’ihi ‘sit-at-home’ dị n’ụbọchị ahụ.
Mana e ruru ihe dịka elekere atọ nke ehihie, mmadụ kpọrọ nwa ya ka ọ bịa rụọrọ ya ụgbọala maka na ọ bụ onye ‘mekanik’.
“Mgbe nwa m bu ọgbatumtum ya na-aga, ndị ji egbe wakporo ya ma gbaa ya egbe n’aka, ọ gbara ọsọ gbaba n’ụlọ mmadụ mana ndị ahụ bịara ebe ahụ gbagbuo ya.”
“Anọ m n’ọrụ ugbo na-anụ ụda egbe aghara aghara, m kpọrọ nwa m n’ekwentị ka m sị ya apụtakwala ezi mana amaghị m na ọ bụ nwa m ka a gbagburu”.
“Otu nwoke zara ekwentị m nwa, sị m na ọ gbagbuo m, asịrị m ya chukwu agaghị ekwe”.
Helen sị na mgbe ọ matara ihe na-eme bụ mgbe o rutere n’ụlọ, ndị ntoroọbịa eburu ozu nwa ya butere ya n’ụlọ.
Ọ sị na amabeghi kpọmkwen ndị gburu nwa ya ji ụmụ atọ kama nọ bụ ndi oji kpuchiri ihu ha.
Ndị ntoroọbịa malitere ime ngaghariiwe n’obodo ha n’ihi ogbugbu e gburu Uchenna malite n’ụbọchị Mọnde ahụ.
Ndị ntoroọbia mechiri okporoụzọ ma kpọọ oku ka ndị ndu obodo ha gbatara ha ọsọ enyemaka maka ogbugbu ndị otu ha.
Kedụ ihe ndị uweojii kwuru?
BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga n’ekwentị.
Ọ sị na ha natara ozi banyere ya, na ha anwuchiela ụfọdụ ndị so na-eme ngagharịiwe ahụ.
Ikenga sị na ha ka na-eme nyocha ịmata ihe butere ngagharịiwe ahụ na mgbe ọ matara na ọ ga-eme ka ọha mara.