Ihe ndị uweojii na-ekwu maka ọkụ a sị gbara n'ahịa Alaba, Legọs

Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii Legọs steeti ekwuola na o nweghị ọkụ ọbụla gbara ahịa Alaba Innational' ụbọchị Fraide, kama ọ bụ ụlọakpata dị ya nso ka ọkụ gbara.

Ha kwukwara na ọ bụ ha mụnyere ọkụ ahụ dịka ha na-achụ ndị ekperima na-ezo n'ụlọ akpakara ndị ahụ ebe ha si akpa ike.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Benjamin Hundeyin, onye kwuru nke n'ozi o wepụtara na akara Twitter ya ụbọchị Fraide sịrị na "ọ bụ akụkọ ụgha" na ọkụ gbara ahịa Alaba International Market'.

" Anyị nwetara ozi nke mere ka anyị wakpoo ụlọ akpakara nwuchie ndị ekperima, mecha mụnye ụlọ akpakara ndị ahụ ọkụ."

Ihe 'Lagos Fire Service' kwuburu

Ụlọọrụ na- agbanyụ ọkụ na Legọs bụ 'Lagos State Fire and Rescue Service' wepụtaburu ozi na-ekwu na ọkụ na-agba n'ahịa Alaba, ndị ọrụ gaa ịgbanyụ ya igwe mmadụ ji iwe chụghachi ha azụ.

N'ozi nke onyeisi ha bụ Margaret Adeseye binyere aka ma wepụta kwuru sị,"Ozi na-eru ụlọọrụ 'Lagos State Fire and Rescue Service' na-ekwu na ọdọahịa dị n'ahia 'Alaba International Market, Ojo, Lagos' na-agba ọkụ."

"Mana a chuchighara ndị ọrụ mgbanyụọkụ si Ojo, Sari-Iganmu na Ajegunle gara, gbochie ha ịrụ ọrụ ha."

Ozi ahụ nke so ihe onyonyo na akụkọ fegharịrị na soshal mida boro ebubo na ọkụ na-agba n'Alaba ma boo ebubo na ha kpọrọ ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ mana ha azaghị ha.

na na-ebo ebubo na oge ndị ọrụ ha gara ịgbanyụ ọkụ ahụ mana ndị mmadụ nọ ebe ahụ ekweghị dịka ha chụchighara ha azụ.

Ozi nke onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Margaret Adeseye binyere aka kwuru sị, "Ozi na-erute ngalaba 'Lagos State Fire and Rescue Service' kwuru na ọdọahịa dị n'ahịa Alaba Inetrational, Ojo,Legọs na-agba ọkụ."

" Mana ndị mmadụ ji iwe chụchighara ndị ọrụ mgbanyụaka si Ojo, Sari-Iganmu and Ajegunle, ha ekweghị ka ha rụọ ọrụ dịịrị ha mana ha kwụ nso."

Akụkọ na ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia kwuburu na ọkụ gbara ọtụtụ ọdọahịa n'ahịa Alaba,laa ngwa ahịa amabeghị ọnụahịa ya n'iyi, ebe ndị mmadụ amabeghị ọnụọgụgụ ha merụrụ ahụ.

Akụkọ ahụ kwukwara na ndịọrụ mmenyụọkụ azaghị oku gbatagbata a kpọrọ ha.

Mana

Ọ bụ anyị sunyere ọkụ na-agba- Ndị uweojii Legos

Mana ndị uweojii Legọs steeti kwuru na ọ bụ ha mụnyere ọkụ n'ụlọ akpara dịka ha na-achụ ndị ekperima na nso ahịa ahụ, na o nweghị ọkụ ọbụla na-agba n'ahịa Alaba.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Benjamin Hundeyin onye kwuru n'ozi o wepụtara na akara Twitter ya taa bụ Fraide sị na "Ọ bụ akụkọ ụgha" na ọkụ gbara ahịa Alaba Market sirị, " Anyị nwetara ozi nke mere ka anyị wakpoo ụlọakpakara nwuchie ndị ekperima, mecha mụnye ụlọ akpakara ndị ahụ ọkụ."