Etụ esiri hụ ozu ụmụwoke abụọ n’ime ụgbọala n’Anambra steeti

Etụ esiri hụ ozụ ụmụnne abụọ n’ime ụgbọala n’Anambra steeti

Ebe foto si, Tochukwu Ikenga

Nkọwa foto, Etụ esiri hụ ozụ ụmụnne abụọ n’ime ụgbọala n’Anambra steeti
Mgbe e biputara ya

Ọnụ na-ekwuru uweojii Anambra steeti bụ Ikenga Tochukwu kwuru na ọbụ eziokwu na-ahụrụ ozụ ụmụwoke abuọ n’ime ụgboala ‘corolla’ n’uzo Enugu-Onitsha dị na Anambra steeti.

Dịka akụkọ siri kwu, umuwoke abụọ ahụ bụ ụmụnne,aha ha bụ Onyema na Nonso.

Ikenga gwara BBCIgbo na ụlọọrụ ụweojii Anambra nke ngalaba Oyi zipụrụ ozi na a hụru ozụ ụmụwoke abụọ n’ime ụgbọala. Ihe ọzọ ha hụru na-ebe ahụ bụ ụgbọala 'Corolla'.

N’okwu ya ‘’Ozi rutere anyị na-ekwu na-eji egbe gbakasịa nwunwoke abụọ ahụ arụ, gbuo ha ma tinye ozu ha n’ime ụgbọala ‘Corolla’ ojii nwere akara AA621 EU Lagos, anyỊ ga-ezipụ ozi n’ọdị n’iru’’

O kwuru na etu osiri gbata kwụrụ, ebugaala ozụ ụmụnwoke ahụ n’ụlọọzụ.