Luis Rubiales: Etu isusu onye egwu bọọlụ ọnụ n'egbugbe ọnụ si tinye onyeisi otu na-ahazi egwu bọọlụ Spain n'okwu na ụka

Luis Rubiales na Jenni Hermoso

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ mba ụwa bụ Fifa akwụsịla onyeisi otu na-ahazị egwuregwu bọọlụ mba Spen bụ Luis Rubiales ọrụ n'ike ọnwa atọ maka isusu onye egwu bọọlụ ọnụ n'egbugbere ọnụ na anataghị ya ikike.

Ozi nke Fifa wepụtara kwuru sị, " Nkwusị ọrụ n'ike a nke malitere taa ka adịgodi abalị 90, ganyere na e mecha ikpe maka ndahịe a."

Fifa nyekwara Rubiales maọbụ onye ọbụla si n'otu egwu bọọ.ụ Spen maọbụ ndị nnọtite anya ha kpọtụrụ Hermoso.

Rubiales gbara afọ 46 jụrụ ịgba arụkwaghị dịka o susuchara Jenni Hermoso ọnụ n'egbugbere ọnụ na anataghị ya ikike na agbanyeghị na ọtụtụ ndị mmadụ na otu dị iche kporo oku ka o mee nke a ụbọchị Fraide..

Mana nwa amadị ahụ gbara isi akwara.

Ọ gwara ndị gbakọrọ n'ọgbaka pụrụ iche otu egwubọọlụ nwere na ọ bụ ndị iro ya na-achụ gharị ya, na ya agaghị arịtu.

Ọ sịrị, " Agaghị m akwa arụkwaghịm, Aagaghị m agba arụkwaghịm."

"Nsusu ọnụ ahụ abụghị ihe e chere eche, ọ bụ ọnụ kpatara ya, anyị abụọ nabatakwara ya."

'Spanish Football Federation' sị na ha ga-akpụpụ Hermoso ụlọikpe

Jenni Hermoso

Otu na-ahazi egwu bọọlụ mba Spen bụ 'Spanish Football Federation' ekwuola na ha ga-agba onye egwu bọọlụ nwaanyị mba ahụ bụ Jenni Hermoso ụlọikpe maka okwu o kwuru banyere onyeisi ha bụ Luis Rubiales.

Rubiales jụrụ ịgba arụkwaghị m dịka okwu pụtara maka na o susuru Hermoso ọnụ dịka otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị Spen meriri ogbo ha ndị Ingland n'asọmpi ikpeazụ Iko mbaụwa Ụmụnwaanyị a sọrọ na Sydney na nsonso a.

Rubiales susuru Hermoso Ọnụ dịka a na-eme emume inye otu egwu bọọlụ ụmụnwaanyị Spen ji otu ọkpụ asaghị asa merịe ndị Ingland ọla nturuugo Ụbọchịụka.

Hermoso kwuru na ya enyeghị Rubiales ikike susu ya ọnụ.

Luis mechara rịọ mgbaghara Mana jụ ịgba arụkwaghị m dịka gọọmentị Spen nakwa ndị ọzọ katọrọ ihe o mere.