Inec enwere ikike iwepụ onye na-azọ ọkwa ọchịchị a mara ikpe nrụrụaka?

Festus Okoye
Nkọwa foto, Festus Okoye bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec.
Mgbe e biputara ya

Onyeisi mgbasa ozi ụlọọrụ Inec bụ Festus Okoye, agwala BBC Igbo na akwụkwọ iwu nke ntuliaka enyeghi ha ohere ime ihe ọbụla gbasara iwepụ onye na-azọ ntuliaka gafegoro nnyocha Inec.

Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ na-akpọ oku ka e wepụ ndị a na-ebo ebubo nrụrụaka ọkachasị ndị nke akụkọ ha na-efesa na social midia.

Okoye kwuru na ọ bụ ụlọikpe ka iwu Naịjirịa nyere ikike iwepụ onye ọbụla anya na-azọ ọchịchị ma ọ bụrụ na a chọpụta na onye ahụ mere mpụ.

Inec

Okoye gara n'ihu kwuo na akwụkwọ iwu Naịjirịa, agba nke 285 amaokwu nke 1A, nyere ụlọikpe na ahụ maka okwu ntuliaka (Election Petition Tribunal) ikike ikpe ikpe dị otu a.

Ọ sị na ya bụ ụlọikpe nwere ikike ịleba anya ma ọnwere onye etozughị etozu so zọọ ya bụ ntụlịaka.

Kama ọ rụtụkwara aka na ọ bụrụ na a mara mmadụ ikpe maka nụrụaka ihe gaferela afọ iri, mara na iwu Naịjirịa agaghị ejideli onye ahụ; ma sịkwa o, na ụlọịkpe nwereike ijide onye ahụ oge ọbụla, ọbụrụgodi mgbe e mechara ntulịka.

Mana Okoye kwusiri ike na ọ bụghị oke na ọrụ Inec iwepụ onye ahụ maọbụ kpụpụ onye ahụ ụlọikpe, kama ọ bụ ndị ya na ha na-azọ ya bụ ọkwa, maọbụ pati ya nwereike ịme otu ahụ.

Nkọwa a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na otu onye so azọ ọkwa ọchịchị ugbua nwere mgbe e boro ya ebubo ime mpụ n'oge gara na mba ofesi.