You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ogbunigwe Ipob/ESN ji siere anyị ọnya agbaala mmadụ abụọ n'ime ha -Ndiagha Naijiria
Ndịagha Naijiria na-ebo ebubo na mmadụ abụọ ndị otu nnwereonwe Biafra bụ Ipob na alaka ọgụ ha bụ ESN ezutela ọbịara- egbu-m gbuo onwe ya dịka ogbunigwe ha jiri siera ndịagha ọnya amala ndị siri ọnya n'Orlu, Okpuru Ọchịchị Orsu n'Imo steeti.
Ha kwuru na ya bụ ọdachi mere n'okporoụzọ Eke Ụtụtụ gawa Orsu dị n'Okpuru Ọchịchị n'Imo steeti n'ụbọchị Wenezde abalị mbụ nke ọnwa Juun afọ 2022.
N'ozi ha wepụtara ụbọchị Wenezde nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Onyema Nwachukwu binyere aka, ha sịrị, "ogbunigwe nke otu 'Indigenous People of Biafra' (IPOB) na alaka ọgụ ha bụ 'Eastern Security Network' (ESN) tinyere agbaala, merụọ otu ahụ a machiri amachi nnukwu ahụ."
Ha kwuru na ndị Ipob ahụ amaghị ama zọnyere ụkwụ n'ogbunigwe ahụ ha tinyeburu n'ọtụtụ ụzọ dị n'Ọlụ, n'Okpuru Ọchịchị dịka ha na-agba ọsọ ịgbalahụ ndị agha na acha ndị omekome ọkụ na mpaghara ahụ.
Ndịagha ndị boro ebubo na ndị Ipob liri ogbunigwe n'ebe dị iche iche ndị Agha na-akparịkarị, rịọ ndị Ọwụwa Anyanwụ ka ha wetara ha ozi maka ebe ọbụla e liri ọgbunigwe , ka ha gaa bupụ ya.
Cheta na tigbuo-zogbuo na-arị elu n'Ọwụwa Anyanwụ dịka oke mwakpo ogige ndịuweojii, oke ogbugbu.
Gọọmenti Etiti na ndị ọrụ nchekwa boro Otu Ipob na ESN ebubo na ọ bụ ha na-akpa mkpamkpa ndị a n'ile mana Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.