Aisha Wakil : Etu e si tụọ 'Mama Boko Haram' mkpọrọ

Aisha Wakil
Mgbe e biputara ya

Ụlọikpe Ukwu dị na Borno steeti atụọla Aisha Wakil, a ma ama dịka 'Mama Boko-Haram' mkpọrọ afọ asaa maka ebubo ịkpa nkata napụ mmadụ ego n'ụzọ aghụghọ.

Dịka ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) si gbaa ama n'akara Facebook ha, Aisha Kumaliya bụ onye ọkaikpe nyere mkpebi ahụ n'ụbọchị Tọzde (Septamba 29,2022).

A tụkwara ndị ọzọ a sị ya na Wakil na-arụkọ ọrụ nga afọ asaa nke gụnyere Tahiru Alhaji,  Saidu Daura na Prince Lawal Shoyode.

Ndị ọzọ a tụrụ nga n'okwu nzufu ego a.

Ebe foto si, EFCC

Nkọwa foto, Ndị ọzọ a tụrụ nga n'okwu nzufu ego a.

Ozi EFCC kwuru na ikpe mara Wakil na 2020 maka isi n'ụzọ agụghọ napụ otu onye ego ruru N15,000,000.00 dịka o kwuru na ọ ga-enyere aka zụtara onye ahụ okụ latrik nke e ji anyanwụ ahazị bụ 'Solar energy'.

Chetakwa na Wakil danyebụrụ na mmanụ ọkụ n'afọ 2019 dịka otu nwoke a kpọrọ Ali Tijjani si kwuo ma kọwa na Aisha na ndị otu ya gwara ya bunye ha nri ọka a kpọrọ 'Biski' ma ha ajụ ịkwụ ya ụgwọ.

N'ọnwa Juun, 2022, ọkaikpe Kumaliya mekwara mkpebi na Wakil ga-aga nga ruo afọ ise maka na a sị na aka ya dị na okwu isi n'ụzọ agụghọ napụ otu onye ego ruru nde naịra 71.

Wakil gwara BBC Igbo na mkparịtaụka n'afọ 2018 etu ya na ndị agha nnupụisi Boko Haram sị akpa.

Na mkparịtaụka ahụ nke wuru ewu na soshal midia, ọ sịrị na "E nwere m ebe m na-eje hụ ha (ndị Boko Haram)."

O kwukwara na mkparịtaụka ahụ banyere Leah Sharibu , na ụmụaka ụmụakwụkwọ Dapchi ndị Boko Haram tọọrọ.

Onye bụ 'Mama Boko Haram'?

Aisha Wakil

Ebe foto si, EFCC

  • Aisha Wakil, Mama Boko Haram bụ onye Igbo, onye Enugwu steeti na-alụ onye Kanuri na Borno steeti bụ Zanna Wakil .
  • Dịka onye ọkaiwu, o nwere otu ọrụ ebere Bekee kpọrọ 'NGO' na-enyere ụmụaka ụwa na-atụ n'ọnụ aka na Borno steeti.
  • Ọ gara akwụkwọ na mahadum 'University of Maidugri' dị na Borno steeti.