You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ndị ojiegbe si tọrọ Fada ọzọ n’Enugu steeti
Ndị ojiegbe wakporo ụlọụka St. Jude’s Catholic Church dị n’obodo Eburummiri dị n'Ibagwa-Aka nke okpuruọchịchị Igbo-Eze South n’Enugu steeti ma tọrọ otu Fada ụlọụka ahụ.
A tọọrọ Fada Victor Ishiwu na-elekọta ụlọụka ahụ n'ụtụtụ Satode.
Ụkọchụkwu Katọlik na-achịkọta deanery ụlọụka ahụ dị n'okpuru ya bụ Fr Jude Odo gbara BBC Igbo ama na ndị omekome ahụ wụbatara n’ogige ụlọụka ahụ n’ehihie Satọde dịka Fada na ndị ụlọụka ahụ na-akwado emume ‘Jesụ bụ Eze’.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Dịka Fada Odo si kwuo, “Ndị ojiegbe ahụ gbara egbe nke mere ndị ụlọụka ahụ jiri malite ịgba ọsọ”
“Ọtụtụ gbakpunyere n’ime akụkụ ụka ahụ ma gbachie ụzọ ya”
“Ebe Fada ahụ na Fada ọzọ gbakpunyere n’akụkụ ọzọ gbachie ụzọ.”
“Ndị omekome ahụ malitere ịgbaka ụzọ ruo mgbe ha ruru ebe Fada ahụ nọ ma tọrọ ya were gbafuo”
"Anyị enyefeela okwu a n'aka ndị uweojii nakwa ndị ọrụ nchekwa ka ha malite ọrụ nnyocha ha."
Fada Odo gbara ama ya bụ ndị omekome amalitela iji ekwenti ya bụ Fada na-akpọ ha ma na-ana ego iji gbara isi nwa amadi ahụ mana na o kwughi ego ole ndị omekome a na-ana.
Ọ gara n’ihu kwuo na ụka Katọlịk anaghị akwụ ndị ntọ maọbụ ndị omekome ego mgbapụta ka ha na-ekpere onye ahụ ekpere.
“Ndị Fada na ndị ụkọchukwu e werele onwe ha nyefee n’ọrụ ụka nke bụ ihe ọbụla gbasara ndụ ha nọ n’aka Chukwu, nke mere anyị na-ekpere ha ekpere.”
O kwuru na ndị ụka amalitela ekpere pụrụ iche n’isi Fada ahụ maka ntọhapụ ya.
Cheta na dịka ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ na Naijiria, ndị ntọ atọọrọla ọtụtụ ndị ụkọchukwu gunyere onyeisi ụka Metọdist na Naịjirịa bụ Prelate Samuel Uche Kanu.
Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, Kanu sị nke ntọrọ ahụ mere n'obodo Leru dị n'Abia Steetị mgbe ha si emume ụka n'Isuochi na-aga ọdọụgbọelụ.
O kwuru na ndị Fulani na-achị ehi wakporo ma tọrọ ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ gụnyere Bishọpụ Owerri.
Chetakwa na a tọrọla ọtụtụ ndị isi ụka ndị ọzọ, ndị sịsta nakwa ndị ụka dị iche iche n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche na nso nso a.
Ọtụtụ mgbe a na-anakarị ego mgbapụta maka ndị a ma a tọrọ ha.
Kanu kọwara na ọ kwụrụ ego ruru otu nde narị naịra tupu a tọhapụ ya.
Kemgbe Jenụwarị afọ 2021, mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa danyere n’ọnọdụ enweghị nchekwa dịka a na-awakpo, na-atọrọ ma na-egbu ndị mmadụ aghara aghara.
Nsogbu adanyụbeghị na-agbanyeghị nkwa gọọmentị steeti dị iche iche na mpaghara ahụ na-ekwe idaju ya.