Etu okwu ala si sere ụmụnne abụọ okwu
Okwu sere ụmụnne abụọ maka ala n'Ogbunike dị n'Anambra steeti abụrụla okwu ụwa niile kpụ n'ọnụ ugbua.
Onye nke e gburu nwunye ya bụ Emenike kwuru na ọ bụ n'ụbọchị Julai 19, 2022 ka nwanne ya nwoke nọkatara gwawa ya na ezinụlọ ya ka ha kwụsị isi n'ihu bee ya gaa ọzọ. makana ala ya abụghị ezi.
N'ọnụ ya, "nwanne m kwuru na ọ bụrụ na anyị akwụsịghị e si ezi ama ahụ aga , na ọ ga-egbu m, gbuo nwunye m nakwa nwa m."

Onyeisi obodo Ogbunike bụ Ikeguru Chukwugozie kwuru na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa obodo Ogbunike buru ma onye nwụrụ anwụ ma ụmụnne abụọ ahụ gawa n'ụlọ ndị uweojii.
N'ọnụ ya, "ọ bụ gọọmenti ga-ama onye gburu mmadụ n'esemokwu ahụ ikpe , mana anyị akwadoghị ihe ọjọ omere."
Ndị uweojii nọ n'Anambra ekwuola na ha amalitela nyocha ihe merenụ kpọmkwem.
Gere ya bụ ihe nkiri n'uju ka ịmatakwuo ka ya bụ ieh si mee.

























