Etu ndị ojiegbe si gbuo mmadụ atọ si n'otu ezinụlọ n'Orlu, Imo steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha na-enyocha ndị gburu mmadụ atọ si n'otu ezinụlọ n'ụbọchị Fraide, abalị iri na asaa nke ọnwa June afọ 2022.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Michael Abattam kwuru na e gburu mmadụ atọ a dịka ha na-enwe ọgbakọ ndị ezinụlọ ha.
"Ndị a nọ na-enwe ọgbakọ imeụlọ ha oge ndị ojiegbe gbagburu ha," Abattam kwuru.
"Nnyocha anyị anyị ga-egosizị kpọmkwem ndị aka ha dị n'ọnwụ ndị a."
Cheta na ihe onyonyo pụtara na soshal midia nke gosiri ebe mmadụ ise ahụ a gbara egbe tọgbọ dịka ọbara juru ha ahụ.
N'onyonyo ahụ, mmadụ abụọ n'ime ha anaghị emegharị ahụ, ebe atọ ndị ọzọ na-ebe akwa na-arịọ ka a gbatara ha ọsọ enyemaka.
Michael Abattam gwara onye nta akụkọ anyị na otu onye n'ime mmadụ atọ ahụ mechara nwụọ n'ụlọọgwụ.
Ka ọ dị ugbua, mmadụ abụọ ka nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ.

Ebe foto si, Screengrab
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Akụkọ fegharịrị nke na aka ndị ọrụ ncheka Imo Steeti a na-akpọ Ebube Agu dị na ya bụ ihe, mana BBC Igbo achọpụtabeghị eziokwu dị na ya bụ akụkọ.
Amaghị kpọmkwem onye bụ onyeisi ndị Ebube Agu n'Imo Steeti
BBC kpọtụụrụ Kọmishọna mgbasaozi Imo steeti bụ Declan Emelumba ịjụta ya onye bụ onyeisi ndị Ebube Agu, mana ọ saghị ekwentị ya.
Ọ sabeghịkwa ajụjụ anyị zigaara ya n'akara whatsapp.
Anyị ka na-agba mbọ ịnụ n'ọnụ ya, maọbụ onye ọbụla na-ekwuchitere gọọmentị Imo steeti.
Ọnọdụ enweghị nchekwa akawanyela njọ na mpaghara dị icheiche n'ọwụwa Anyanwụ n'ọdị nso.
Orlu so n'otu ebe ya bụ enwghị nchekwa kacha njọ.
Ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ọ bụ ndị otu na-azọ nnwereonwe a kpọrọ Ipob, nakwa ndị ọgụ ha bụ Eastern Security Network, na-akpa ike ọjọọ ndị a.
N'ọdị nso a, na mpaghara Orlu, ndị ekperima nwụchiri Nneka Matthew na Linus Audu bụ di na ndị agha, dịka ha na-aga ime emume agbamakwụkwọ ha.
Ha gburu di na nwunye a, bepụ ha isi, ma tinye onyoonyoo ya na soshal midia ka ụwa hụrụ.





























