You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe mere Umahi ji nye iwu ka ndị uweojii nwụchie onyeisi APC n'Ebonyi Steeti
Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi enyela iwu ka ndị uweojii nwụchie Stanley Okoroemegha bụ onyeisi pati APC na Steeti ahụ nakwa Eni Uduma Chima bụ onye na-azọ ọkwa omeiwu ga-anọchi anya Afikpo North/Afikpo South n'ụlọ omeiwu nta Naịjirịa.
Umahi kwuru na ọ bụ ha kpatara ọnwụ mmadụ atọ lara mmụọ nakwa mmebi ọtụtụ ihe na mpaghara na mpaghara Ekoli-Edda n'ụbọchị Mọnde, Disemba 26, 2022.
O kwuru nke a dịka ọ gara na mpaghara ahụ iji were anya ya hụrụ ihe mere ebe ahụ n'ụbọchị Tuzde.
O nyekwara iwu ka ndị uweojii nwụchie ndị niile aka ha dị n'ọgbaaghara ahụ ma hụ na ikpe ziri ezi weere ọnọdụ.
Umahi machikwara inwe ọgbakọ ọbụla na mpaghara Edda ruo mgbe udo ga-alọghachi n'ebe ahụ.
Ọ gwara Kọmishọna ndị uweojii Ebonyi steeti ka o ziga ọtụtụ ndị uweojii na mpaghara ahụ iji gbochie ọgbaaghara ọzọ ịdapụta.
Etu ọgbaaghara si taa isi mmadụ atọ n'Ekoli-Edda, Ebonyị steeti
Ọgbaaghara dapụtara n'etiti ndị nkwado APC n'Ebonyi Steeti ataala isi mmadụ atọ, n'ụbọchị 26 nke ọnwa Disemba 2022.
Nsogbu a bụ n'etiti mmadụ abụọ welitere isi na APC Ebonyi, otu n'ime ha bụ Stanley Okoroemegha, bụ onyeisioche APC n'Ebonyi, ebe onye nke ọzọ bụ Eni Uduma Chima, bụbu onyeisioche okpuru ọchịchị Ekoli-Edda nakwa onye na-azọ ọkwa omeiwu na ntuliaka 2023.
Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi Steeti bụ Chris Anyanwu si kwuo, ndị uweojii nwetara ozi n'ebe elekere anọ na ọkara nke ehịhịe ụbọchị 'Boxing Day', nke na-ekwu na egbe na-ada aghara aghara na mpaghara Ekoli-Edda.
Akụkọ kwuru na ndị na-agba egbe a bụ ndị ọrụ nche a na-akpọ Ebube Agu ndị so nna ha ukwu bụ Stanley Okoroemegha, mana ha na ndị ntorobịa na-akwado Chima Eni takọtara isi.
"Dịka a na-agba egbe a, mgbọ tụrụ otu onye aha ya bụ Eseni Kalu Egwu, bụ otu n'ime ndị isi ndị ntorobịa na mpaghara ahụ," Chris Anyanwụ kwuru.
"Nke a were ndị otu ndị ntorobịa nke ọzọ iwe, ha wee ga gbuo otu onye ọzọ aha ya bụ Eme Orji, bụ nwanne Stanley Okoroemegha nakwa otu onye uweojii ọzọ."
"Ndị ntorobịa a gbakwara ụlọ Stanley Okoroemegha ọkụ, kurie ụgbọala ya nakwa otu ụgbọala ọzọ bụ nke ndị uweojii."
"Oge ndị otu anyị gara ebe ahụ ịga mee ka udo lọghachi, ndị ntorobịa ahụ wakpokwara ụgbọala anyị, mana ndị otu anyị gbalahụrụ ha."
Chris Anyanwu kwuru na ha ebugala ozu mmadụ ato ahụ e gburu n'ụlọozu, ma nwuchikwaa ndị ntorobịa atọ n'ime ndị kpara aghara ahụ, ebe ndị ọzọ gbara ọsọ.
"Anyị ejichikwaala mmadụ abụo butere ọgbaaghara a iji mee ka ọnụma ndị mmadụ dajụọ, mana nnyocha miri emi amalitela ugbua," Anyanwu kwuru.