You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee ọrịa maamiri na-agbọ ụfụfụ na-egosi n'ahụ gị
Igbo sị na anyụkọọ maamiri ọnụ, ọ gbọọ ụfụfụ.
N’anya Igbo, maamịrị na-agbọ ụfụfụ gosiri nkwekọrịta, njikọ, ịdị n’otu wdgz.
Mana mmụta na-akọwa na maamịrị na-agbọ ụfụfụ na-ekwu karịa ihe ndị a.
Ya bụ mmụta gosiri na ọtụtụ ihe nwereike ibute amịrị mmadụ ịgbọ ụfụfụ.
Ihe ndị a gụnyere nri, ọgwụ onye ahụ ṅụrụ maọbụ ahụike onye ahụ.
Ihe mbụ anyị matara bụ na ọ bụrụ na akpa maamịrị gị ju eju, ihe ọ pụtara bụ na amịrị ga-akpasị onye ahụ ike.
Ọ bụrụ na onye ahụ gaa ịnyụ ya bụ amịrị, ọ ga-eji ike apụta n’ahụ ya.
Ike ahụ o ji ekwopụta n’ahụ ga-eme ka ọ na-awụ awụ n’ime ọnụ mposi nke ga-eme ka ọ gbọọ ụfụfụ nnukwu.
Ọ bụrụ na ọ bụghị nke a, ihe ndị ọzọ nwereike ibute amịrị gị ịgbọ ufufu kwesiri ịme ka ị ga hụ dọkịnta gị.
Gịnị ka maamịrị na agbọ ụfụfụ na-egosị maka ahụike gị?
Maamịrị mmadụ nwereike ịgbọ ụfụfụ nwamgbenta kwamgbe kwamgbe. Ọ bụ maamịri ji ike apụta n’ahụ mmadụ na-ebutekarị nke a.
Ọ bụrụ na ya bụ ụfụfụ gbọkarịa, mara na ya bụ ụrụ kwere izu aghọwala ọnwụ.
Onye ahụ kwesiri ịga hụ dọkịnta.
O nwereike ị bụ na ahụ esichaghị onye ahụ ike.
Onye dọkịnta ahụike gbasara ọwa akịrị Bekee kpọrọ Nephrologist na-arụ na UNTH Enugu achọghị ịkpọ aha ya sị na amịrị na-agbọ ụfụfụ na ihe ndị a na-egosi na nsogbu dị:
- Ọ bụrụ na aka, ukwu, ihu na afọ onye ahụ na-azaaza, ọ nwereike ịbụ na akịrị ya nwere nsogbu.
- Ọ bụrụ na ike na-agwụkarị onye ahụ.
- Ọ bụrụ na agụụ nrị anaghị agụ onye ahụ.
- Agbọọ ịhụ onye ahụ
- Ụra anaghị atụ onye ahụ.
- Amịrị onye ahụ kochiri ekochi
- Amịrị na-acha uhie uhie
- Ọ bụrụ nwoke, uhe na-apụta onye ahụ n’ahụ anaghị ebu ibu.
- Ọ bụrụ nwoke, onye ahụ anaghị atụwalị nwaanyị ime.
Gịnị na-ebute maamịrị ịgbọ ụfụfụ?
Amịrị nwereike ịgbọ ụfụfụ ma ọ bụrụ na onye ahụ anaghị aṅụ mmịri nke ọma.
Nke a ga-eme na amịrị onye ahụ ga-arọarọ n’anya gọsịkwa na mmịrị kọrọ onye ahụ n’ahụ.
Amịrị ịgbọ ụfụfụ nwekwereike igosi na protinụ karịrị onye ahụ n’ahụ.
Ihe ahụ gị na-eme bụ ịzapụ mmiri na akụrụngwa ahụ gị ọchọghị n’ọbara tịnye ha na amịrị gị.
Protinụ na ihe ndị ọzọ buru ibu na-agaghị aba na akịrị (Kidney) gị maka ịzacha ha ga-anọdị na ọbara na-enye nsogbu.
Ọ bụrụkwa na akịrị gị bụ kidney nwee nsogbu ọ gaghị arụlị ọrụ ya ka o kwesiri.
Akiri mebiri emebi ga-ahapụ protinụ ka ha na-abenye na maamiri ghara isi n'ime akịrị gafee.
Ya bụ Dọkịnta sị na ọ bụ nke a ka a na-akpọ proteinuria.
Nke a na-egosi na oteela ya bụ akịrị nwewere nsogbu maọbụ na ọ mebiela nke Bekee na-akpọ “renal disease”.
Kpọtụrụ dọkịnta gị maọbụrụ na amịrị gị na-agbọ ụfụfụ mgbe niile.
Ihe ọzọ na-akpata amịrị ịgbọ ụfụfụ bụ mgbe uhe (sperm) lachiri azụ n’amụ karịa ịpụta apụta nke Bekee na-akpọ “retrograde ejaculation”.
Nke a nwereike ime maọbụrụ na ị nwere ihe ndị a:
Ọrịa shuga, ọgwụ e ji agwọ ọbara mgbelielu na prostate zaraaza wereike ibute ya, akwara nwere nsogbu nke ọkpụkpụazụ nwere nsogbu butere, ịwa ahụ na prostate maọbụ n’ọwa amịrị.
Nke ahụ ga-eme ka maamịrị gbọọ ụfụfụ nwaobere.
“Amyloidosis” bụ ọnọdụ protinụ tọrọ n’ahụ mmadụ malite ịnye nsogbu n’akịrị mmadụ.
Ọ naghị emekarị mana ọ na-enye nsogbu nke ukwuu.
Mkpụrụ ọgwụ ụfọdụ dịka Pyridium, AZO Standard, Uristat, AZO nwekwaraike ịme ka maamịrị mmadụ gbọọ ụfụfụ. Ihe a bụ ọgwụ e ji akwọ ahụmgbu dị n’ime utu mmadụ.
Mgbe ụfọdụ, ọgwụ e ji saa ọnụ mposi nwekwaraike ịme ka ọ gbọọ ụfụfụ.
Kedụ ka e sị akwụ amịrị ịgbọ ụfụfụ?
Naanị ịṅụ mmiri ga-eme ka amịrị gị kwụsị ịgbọ ụfụfụ maọbụrụ na ọ bụ aṅụghị mmiri butere ya.
Mana ọ bụrụ na ọ karịa nke a, gaa hụ dọkịnta gị.