Lee ọrịa maamiri na-agbọ ụfụfụ na-egosi n'ahụ gị

Mgbe e biputara ya

Igbo sị na anyụkọọ maamiri ọnụ, ọ gbọọ ụfụfụ.

N’anya Igbo, maamịrị na-agbọ ụfụfụ gosiri nkwekọrịta, njikọ, ịdị n’otu wdgz.

Mana mmụta na-akọwa na maamịrị na-agbọ ụfụfụ na-ekwu karịa ihe ndị a.

Ya bụ mmụta gosiri na ọtụtụ ihe nwereike ibute amịrị mmadụ ịgbọ ụfụfụ.

Ihe ndị a gụnyere nri, ọgwụ onye ahụ ṅụrụ maọbụ ahụike onye ahụ.

Ihe mbụ anyị matara bụ na ọ bụrụ na akpa maamịrị gị ju eju, ihe ọ pụtara bụ na amịrị ga-akpasị onye ahụ ike.

Ọ bụrụ na onye ahụ gaa ịnyụ ya bụ amịrị, ọ ga-eji ike apụta n’ahụ ya.

Ike ahụ o ji ekwopụta n’ahụ ga-eme ka ọ na-awụ awụ n’ime ọnụ mposi nke ga-eme ka ọ gbọọ ụfụfụ nnukwu.

Ọ bụrụ na ọ bụghị nke a, ihe ndị ọzọ nwereike ibute amịrị gị ịgbọ ufufu kwesiri ịme ka ị ga hụ dọkịnta gị.

Gịnị ka maamịrị na agbọ ụfụfụ na-egosị maka ahụike gị?

Maamịrị mmadụ nwereike ịgbọ ụfụfụ nwamgbenta kwamgbe kwamgbe. Ọ bụ maamịri ji ike apụta n’ahụ mmadụ na-ebutekarị nke a.

Ọ bụrụ na ya bụ ụfụfụ gbọkarịa, mara na ya bụ ụrụ kwere izu aghọwala ọnwụ.

Onye ahụ kwesiri ịga hụ dọkịnta.

O nwereike ị bụ na ahụ esichaghị onye ahụ ike.

Onye dọkịnta ahụike gbasara ọwa akịrị Bekee kpọrọ Nephrologist na-arụ na UNTH Enugu achọghị ịkpọ aha ya sị na amịrị na-agbọ ụfụfụ na ihe ndị a na-egosi na nsogbu dị:

  • Ọ bụrụ na aka, ukwu, ihu na afọ onye ahụ na-azaaza, ọ nwereike ịbụ na akịrị ya nwere nsogbu.
  • Ọ bụrụ na ike na-agwụkarị onye ahụ.
  • Ọ bụrụ na agụụ nrị anaghị agụ onye ahụ.
  • Agbọọ ịhụ onye ahụ
  • Ụra anaghị atụ onye ahụ.
  • Amịrị onye ahụ kochiri ekochi
  • Amịrị na-acha uhie uhie
  • Ọ bụrụ nwoke, uhe na-apụta onye ahụ n’ahụ anaghị ebu ibu.
  • Ọ bụrụ nwoke, onye ahụ anaghị atụwalị nwaanyị ime.

Gịnị na-ebute maamịrị ịgbọ ụfụfụ?

Amịrị nwereike ịgbọ ụfụfụ ma ọ bụrụ na onye ahụ anaghị aṅụ mmịri nke ọma.

Nke a ga-eme na amịrị onye ahụ ga-arọarọ n’anya gọsịkwa na mmịrị kọrọ onye ahụ n’ahụ.

Amịrị ịgbọ ụfụfụ nwekwereike igosi na protinụ karịrị onye ahụ n’ahụ.

Ihe ahụ gị na-eme bụ ịzapụ mmiri na akụrụngwa ahụ gị ọchọghị n’ọbara tịnye ha na amịrị gị.

Protinụ na ihe ndị ọzọ buru ibu na-agaghị aba na akịrị (Kidney) gị maka ịzacha ha ga-anọdị na ọbara na-enye nsogbu.

Ọ bụrụkwa na akịrị gị bụ kidney nwee nsogbu ọ gaghị arụlị ọrụ ya ka o kwesiri.

Akiri mebiri emebi ga-ahapụ protinụ ka ha na-abenye na maamiri ghara isi n'ime akịrị gafee.

Ya bụ Dọkịnta sị na ọ bụ nke a ka a na-akpọ proteinuria.

Nke a na-egosi na oteela ya bụ akịrị nwewere nsogbu maọbụ na ọ mebiela nke Bekee na-akpọ “renal disease”.

Kpọtụrụ dọkịnta gị maọbụrụ na amịrị gị na-agbọ ụfụfụ mgbe niile.

Ihe ọzọ na-akpata amịrị ịgbọ ụfụfụ bụ mgbe uhe (sperm) lachiri azụ n’amụ karịa ịpụta apụta nke Bekee na-akpọ “retrograde ejaculation”.

Nke a nwereike ime maọbụrụ na ị nwere ihe ndị a:

Ọrịa shuga, ọgwụ e ji agwọ ọbara mgbelielu na prostate zaraaza wereike ibute ya, akwara nwere nsogbu nke ọkpụkpụazụ nwere nsogbu butere, ịwa ahụ na prostate maọbụ n’ọwa amịrị.

Nke ahụ ga-eme ka maamịrị gbọọ ụfụfụ nwaobere.

“Amyloidosis” bụ ọnọdụ protinụ tọrọ n’ahụ mmadụ malite ịnye nsogbu n’akịrị mmadụ.

Ọ naghị emekarị mana ọ na-enye nsogbu nke ukwuu.

Mkpụrụ ọgwụ ụfọdụ dịka Pyridium, AZO Standard, Uristat, AZO nwekwaraike ịme ka maamịrị mmadụ gbọọ ụfụfụ. Ihe a bụ ọgwụ e ji akwọ ahụmgbu dị n’ime utu mmadụ.

Mgbe ụfọdụ, ọgwụ e ji saa ọnụ mposi nwekwaraike ịme ka ọ gbọọ ụfụfụ.

Kedụ ka e sị akwụ amịrị ịgbọ ụfụfụ?

Naanị ịṅụ mmiri ga-eme ka amịrị gị kwụsị ịgbọ ụfụfụ maọbụrụ na ọ bụ aṅụghị mmiri butere ya.

Mana ọ bụrụ na ọ karịa nke a, gaa hụ dọkịnta gị.