You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
PVC Registration: Ụzọ ise ndị ntorọbịa si akwado atụmatụ idebanye aha maka ịtụ vootu
Dịka ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na-eru nso, ọtụtụ mmadụ na-agba mbọ ugbua idebanye aha ha n'akwụkwọ ntuliaka ma nweta akwụkwọ ikike a kpọrọ 'Permanent Voters Card' (PVC).
Ọ bụ ọrụ dịịrị ngalaba ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (INEC) idebanye aha ndị mmadụ, mana ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị ntorọbịa etinyela ịhụ na ya bụ ndebanye aha na-aga nke ọma.
Nke a bụ maka na ọnụọgụgụ ndị na-acho idebanye aha n'akwụkwọ ntuliaka buru nnukwu ibu, nke mere na ndị ọrụ Inec na-enwe nnukwu ọgbatauhie n'idebanye aha mmadụ niile.
Ka ọ dị ugbua, ndị ntorọbịa amalitela inye aka ka ya bụ ọrụ na-aga aga; obere azụ kpata obere nkụ, nnukwu azụ kpata nnukwu nkụ.
Lee ụfọdụ ihe ndị ha na-eme:
1) Ịgagharị na-ekwusa oziọma PVC
Ndị ntorọbịa haziri onwe ha na-akpagharị n'ogbe ha dị icheiche na-agwa ndị mmadụ ka ha ga debanye aha maka ịtụ vootu.
Ọtụtụ n'ime ha na-ebipụta akwa na akwụkwọ nkuzi iji kọwaa uru pvc bara.
Imirikiti oge, ọ bụ ego akpa ha ka ha ji eme ihe niile ndị a, mana ha ji aṅụrị eme ya.
2) Iwepụta oge nakwa akụrụngwa ha
N'ebe ụfọdụ, ndị ntorọbịa na-ewepụta igwe kọmputa ha, maọbụ igwe ọkụ ha iji nyere INEC aka ka igwe kọputa ha nakwa ihe ndị ọzọ gharra ịnyụ ọkụ.
Ndị ọzọ kwa na-ewepụta onwe ha, na-akwụghị ha ụgbọ ọbụla, inyere Inec aka ịhazi ndị mmadụ n'ahịrị n'ahịrị ka ihe a na-eme wee na-aga aga.
3) Iweta ihe oriri na ọṅụṅụ
N'ihi nnukwu ọnụọgụgụ ndị chọrọ idebanye aha ha, ndị ọrụ Inec anaghị enwe ohere ikuli ga chọọ nri ha ga-eri.
Nke a mere ọtụtụ ndị ntorobịa ji azụtara ndị ọrụ Inec ahụ ihe oriri dịka ha na-arụ ọrụ ha.
Lee etu UtaziJay siri kwupụta maka nke a site n'akara Twitter ya:
4) Idebe okirikiri ndebanye aha ọcha
Ụfọdụ ndị ntorobịa ewepụtela onwe ha ịzacha ogige ebe ndị Inec na-anọ edebanye aha ndị mmadụ maka PVC.
Nke a bụ ụzọ ha si akwado ndị ọrụ Inec ka obi na-adị ha mma n'ịrụ ọrụ ha.
5) Ihazi ọgbakọ nlereanya n'efu
Ọtụtụ ndị otiegwu, ndị ọkpa ọchị, na ndị ọzọ na-eme ihe nkiri ahaziela ọgbakọ nlereanya ebe ndị ntorobịa ga-anọ nwee obi aṅụrị na-akwụghị ụgwọ ọbụla, ma werekwa ohere ahụ debanye aha ha n'akwụkwọ ntuliaka.
Ha na-akpọta ndị ọrụ Inec n'ọgbakọ ndị a iji debanye aha ndị niile na-enwetabeghị PVC ha.
Dịka ikuku PVC na-eku ebe niile, ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ bụ, onye ọbụla tozurula afọ iri na asatọ mana o nweghi PVC ya na Naịjirịa, gịnị ka ọ ga-asị gbochiri ya?