‘Ọ kaara mụ mma na m nwụrụ na Lebanon karịa ịlaghachi Naịjirịa’

Nwaafọ Naịjirịa nọ Lebanon

Ebe foto si, Akinbobola

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ọ bụrụ na Gọọmenti Naịjirịa zigaa ụgbọelu taa iji kpọghachi ụmụafọ ha nọ na Lebanọn, ọtụtụ ndị Naịjirịa agaghị abanye.

Ụfọdụ ndị Naịjirịa bi na Lebanọn gwara BBC na ọ ga-akara ha mma ịnwụ na mba ahụ karịa ịlọghachi Naịjirịa.

Ha sịrị na ọ ga-akara ha mma ịnwale chi ha na Lebanọn bụ ebe Izrel na-awakpo ụfọdụ akụkụ ya karịa ịlọghachi Naịjirịa ebe ha amaghị etu ọdịnịihu ha ga-adị tinyere ọnọdụ ihe isiike.

Otu ọnụ na-ekwuchitere Mịnịstrị Naịjirịa na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ gwara BBC n’ụbọchị Fraịde 11 Ọktoba 2024 na ọ bụ naanị ndị Naịjirịa iri asaa (70) n’ime puku abụọ (2000) nọ Lebanọn debanyere aha maka mkpọghachi.

Ọ sịrị na enweghị ndị a ga-akpọghachị ruo mgbe ha “nwetara ọnụọgụ mmadụ ga-eju ụgbọelu.”

Otu nwaafọ Naịjirịa na-elekọta ụlọ mmadụ na Beirut bụ Adeola sịrị “enwere m nne na nna na-ejighị ahụ n’ụlọ (Naịjirịa), onye ga-eletara m ha, onye ga-akwụrụ m ụgwọ m ji na Naịjirịa?”

“Ọ kaara m mma na m nwụrụ na Lebanọn karịa ịlaghachi Naịjirịa,” ka o kwuru.

Adeola gbara afọ iri abụọ na ise (25) ebiela Lebanọn afọ ise ma na-arụkwara otu ezinaụlọ ọrụ na mba ahụ. O kwuru na ya gbara ọsọ oge mwakpo Izrel bịara karịa.

Ndị kpọrọ ya ọrụ hapụrụ ya rie mbọmbọ oge nnukwu anwụrụ kpuchiri mpaghara ndịda nke isi obodo mba ahụ bụ Beirut dịka atụchara ogbuniigwe n’ebe dị iche iche.

Ha kwere nkwa ịga n’ihu na-akwụ ya ụgwọọnwa dọla narị atọ $300 ọ bụrụ ma ya nọgide na-elekọtara ha ụlọ.

Ụgbua, ọ maghị mgbe a ga-atụ ogbuniigwe nke ga-atụ n’ụlọ a sị ya lekọta mana ụgwọ ndị e jikọrọ, ego nlekọta ahụike nne na nna na-ejighị ahụ tinyere mkpa ndị ọzọ e ji ego egbo na Naịjirịa pụtara na ịlaghachi ụlọ abụghị maka ya.

Ebe Izrel wakporo na Lebanon

Ebe foto si, Getty Images

Dịka Izrel welitere aka na mwakpo ha na-eme Lebanọn, mbaụwa dị iche iche agwala ụmụafọ ha ka ha lọghachi.

Gọọmenti Naịjirịa soro kpọọ oku ahụ dịka ha kwupụtara gbasara atụmatụ ịkpọghachi ụmụafọ ha.

Ọ bụladị ka ndị kpọrọ ha ọrụ hapụrụ ha rie mbọmbọ tinyere ụda egbe, ogbuniigwe nakwa mmadụ ndị na-atụ egwu ma na-agbaga ebe ọzọ maka nchekwa, ịlaghachi ụlọ abụghị maka ụmụafọ Naịjirịa.

Onyeisioche ndị Naịjirịa bi na Lebanọn bụ Rowland Aigbovbiosa gwara BBC na ọtụtụ ndị Naịjirịa bi Lebanọn bụ ha na-ahụ maka mkpa ego n’ezinaụlọ ha dị iche iche nke pụtara na ha ịlọghachi Naịjirịa pụtara ibukwasa ezinaụlọ ha ibu.

“Ọnọdụ Naịjirịa anaghị adọ ụsa,” ka o kwuru.

Aigbovbiosa kwukwara na ọtụtụ mmadụ kwenyere na mkparịtaụka udo nwere ike ị dị n’etiti mba abụọ ahụ na-alụ agha oge na-adịghị anya.

O kwukwara na ụfọdụ ndị ọzọ na-atụ egwu na ha agaghị enwekwa ohere ịlaghachi Lebanọn ọzọ ọ bụrụ ma ha laa.

Ebe Izrel wakporo na Lebanon

Ebe foto si, Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Nwaafọ Naịjirịa ọzọ na-agbara otu ezinaụlọ na Lebanọn odibo bụ Joy gwakwara BBC na ya anaghị alọta Naịjirịa ọbụla.

Nke a bụ n’ihi ibu ego o nwere na Naịjirịa ebe o kwuru olileanya na-adịghị na ya ga-enweta ọrụ na-akwụ ezigbo ụgwọ.

Ọ sịrị “e nweghị onye chọrọ ịnọ n’ọnọdụ ebe ọ ga-ahọrọ ị nọrọ n’agha (na mba ofesi) karịa ịlọghachi na mba ya. Mana agaghị m agbara ọsọ aghachi Naịjirịa ebe gọọmenti na-enweghị ihe ọbụla ha ga-emere anyị.”

Ọnọdụ obibi ndụ ọjọọ na-arị elu, akwụkwọ ego Naịra na-enweghị ume tinyere enweghị ọrụ na ụbịam ọnụntụ e meela ka ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa gaa mba ofesi iji nwee ike zere mmiri.

Ka ọ dị ugbua, otu onye nnyocha na-arụ ọrụ dịka onye nlekọta ụlọ na Lebanọn bụ Akinbobola ekepụtala ohere n’ọbaozi Whatsapp iji kpọkọta ndị Naịjirịa nnile bi na mba ahụ maka ịmata etu ọnọdụ ha dị kwa ụbọchị.

Ya onwe ya enweghịkwa ike ịhapụ Lebanọn ugbua n’ihi na ụmụnne ya ndị obere atọ nọ Naịjirịa dabeere n’ebe ọ nọ maka igbo mkpa ego.

Ọ bụrụ na ọ hapụ ọrụ ya na Lebanọn, agụmaakwụkwọ ụmụnne ya nwereike ịkwụsị. Dịka o siri kwuo, ebe o siri ka njọ bụ ịhụta onwe ya dịka ibu arụ nye ezinaụlọ ya ọ bụrụ ma ọ laa.

Dịka ụlọorụ na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi na mba ndị ọzọ bụ Nigerians in Diaspora Commission (NIDCOM) siri kwuo, enwebeghị nwaafọ Naịjirịa nwụrụla maọbụ nweta mmerụahụ kemgbe ọgbaaghara dị n’etiti Izrel na Hezbollah malitere.

Mana ha enyela ndị Naịjirịa ndụmọdụ ka ha pụọ na mpaghara agha ahụ kachasị njọ ma gaa mpaghara Lebanọn ndị ọzọ dịtụ mma.