Ndi uweojii akpọpụtala onye boro nwaanyị ahụ ebubo mere e ji gbaa ya ọtọ n'Aguleri

Ndị a sị gbara nwaanyị ajadu ọtọ n'Aguleri

Ebe foto si, Anambra State Police

Mgbe e biputara ya

Ndị uweojii Anambra Steetị sị ha anwụchiela ihe ruru mmadụ isii gụnyere onye dibia anyanzụ aka ha dị n'ịgba otu nwaanyị ọtọ n'ebubo na o gburu di ya n'obodo Aguleri.

Ha sị na a nwụchiri ndị a mgbe he lechara ihe onyonyo ahụ ma chọpụta ụfọdụ ndị aka ha dị n'ịkpa arụ ahụ.

Ndị a ha nwụchiri gụnyere; Anthony Obanye, Udalor Egwuatu Nnalue, Godwin Ezechukwu, Nonso Ezechukwu, Philomena Onyekwe na Chinyere Mmachi.

Ha sị na nyocha gosiri na dị nwaanyị ahụ bụ Udorji Egwuatu nọbu n'ute ọrịa mgbe nwanne ya nwoke bụ Udalor kpọgara ya na nke Anthony bụ onye dibia ka ọ gwọọ ya.

Anthony sị na o sachara nwoke ụchụ ma nyekwa ya ọgwụ mgbọrọgwụ ndị ọ ṅụrụ tupu ọ nwụọ.

Ha sị na ọ bụ dibia Anthony gwara ezinaụlọ Udorji na ọ nwụrụ maka na nwunye ya na-agba n'ezi.

Ndị uweojii dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kwụsị ikesasị ihe onyonyo, na ọ bụ imetọ ugwu dịịrị nwaanyị ahụ.

Ha kwekwara nkwa na a ga-eme nyocha iji hụ na e nyere ikpe ziri ezi.

Ihe ndị obodo Aguleri kwuru banyere ya

Ndidi Mezue

Ebe foto si, ABS

Nkọwa foto, Ndidi Mezue bụ Kọmishọna na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị n'Anambra steeti gara Aguleri ịma ebe okwu kwụ

Ndị obodo Aguleri sị ha nwuchiri mmadụ asatọ ha na-enyo so gbaa nwaanyị ajadu ahụ ọtọ ma kpụgharịa ya n' Eziagulu-Otu, dị n'Aguleri.

Otu n'ime ndị enyemaka Eze Chukwuemeka Eri nke Aguleri bụ Anthony Odumegwu, nke aha otutu ya bụ 'Odumobi nke isii' n'obodo Idoeri, gwara BBC Igbo etu e si nwụchie mmadụ asatọ ahụ.

Ọ kọwara etu otu ụmụnwaanyị dị iche iche si gbakọọ, foro ntutu taa sị na ha ga-ahụ na ndị gbara nwaanyị ahụ ọtọ ma kpụgharịa ya ga-atarịrị ahụhụ so ya.

O kwukwara na nwaanyị ahụ a gbara ọtọ nọzị n'aka nwunye aka na-achị Anambara steeti bụ Ebelechukwu Obiano ugbua, dịka Ndidi Mezue bụ kọmishọna na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị na steeti ahụ garukwara obodo ahụ.

O kwuru na ndị Aguleri kwuru na onye ọbụla a hụrụ n'ime ihe onyonyo ahụ ga-anata ntaramahụhụ gọọmentị.

Odumobi kwuru na ndị Aguleri amalitela ịgagharị na-atụ aka na-akpọpụta ndị ha hụrụ n'ihe onyonyo ahụ fesara na soshal midia.

Ihe ụfọdụ ụmụnwaanyị a ma ama kwuru banyere ya

Ezigbo iwe na-ewe m maka nwaanyị a gbara ọtọ n'Anambra - Stella Oduah

Stella Oduah

Ebe foto si, Stella Oduah/Facebook

Stella Oduah bụ sinetọ na-anọchite anya Anambra North n'ụlọomeiwu ukwu Naịjiria kwuputere mwute ya gbasara etu e si gbaa otu nwaanyị ọtọ n'Aguleri.

O dere na Twitter ya na ezigbo iwe na-ewe ya n'ihi na ọ maghị etu mmadụ ga-esi meso mmadụ ibe ya ụdịrị omume ọjọọ ahụ e mesoro ya bụ nwaanyị nọ n'ihe onyonyo ahụ.

Stella Oduah

Ebe foto si, Twitter/Stella Oduah

Ọ gara n'ihu kwuo na o zigala ndị otu ya ka ha hụ na a kpọgara nwaanyị ahụ ụlọọgwụ, ka ha tinye ya ebe ọ ga-amụta ọrụ aka ma nye ya ego ọ ga-eji bido nke ya ma ọ mụtachaa, chọpụta ma ọ chọrọ ịgụ akwụkwọ, ma gwakwa ndị ọrụ nchekwa ka ha garuo n'isi mmiri n'ihe gbasara ihe e mere nwaanyị ahụ.

Stella Oduah

Ebe foto si, Screengrab

Stella Oduah

Ebe foto si, Screengrab

Stella Oduah

Ebe foto si, Screengrab

Stella Oduah

Ebe foto si, Screengrab

Ọtọ a gbara na mkpụgharị a kpụgharịrị nwaanyị a na-ewute m - Obiano

Ebelechukwu Obiano

Ebe foto si, Ebelechukwu Obiano/Facebook

Nwunye gọvanọ Anambra steeti bụ Ebelechukwu Obiano, katọrọ ọtọ a gbara na mkpụgharị a kpụgharịrị nwaanyị ahụ.

N'ozi si n'aka Emeka Ozumba bụ osote onyeisi mgbasaozi nye gọvanọ ziputere, Obiano kwuru na omume e mesoro nwaanyị ahụ bụ nke jọgburu udele ma sigbuo nkakwụ.

O kwuru sị "Anụla m maka ihe onyonyo gosiri ebe e mesoro otu nwaanyị omume jọgburu onwe ya. Ọ bụghị naanị na ha katọrọ ya n'ihu ọha maka ebubo ịgba n'ezi, ha kpụgharịrị ya n'ụzọ ebe ọ gba ọtọ."

"M ga-ekwu na agwa a ndị a kpara site n'igbahapụ iwu ma wụọ nwaanyị a n'ala etu a, na-asọ oyi."

Ọ gara n'ihu kwuo:

"Kedụ etu mmadụ ga-esi chee uche ime mmadụ ibe ya ụdịrị ihe ọjọọ a n'ụwa ugbua? Ọ na-ewute m nke ukwuu n'ihi na ọ bụ imewa obi na ịkparị ụkpụrụ anyị nwere dịka mmadụ."

"Ọ wụnyekwala aja na garị na mbọ niile anyị gbara n'ime afọ asatọ gara aga ikwalite nkwanye ugwu n'ebe ụmụnwaanyị nọ."

Na nchịkọta, ọ gwala ndị ọ bụ ọrụ ha ka ha chọpụta ndị mere ihe a ma nye ha ntaramahụhụ ruru ha.

Ked ihe ndị isi obodo na-ekwu make ihe mere?

Aguleri

Ebe foto si, Odumobi n'Aguleri

Obi adịghị ndị Aguleri mma maka ihe a kpọrọ arụ mere na be ha nso nso a ebe a gbara otu nwaanyị ọtọ ma kpụgharị ya n'obodo.

Otu n'ime onye enyemaka Eze ndị Aguleri bụ Anthony Odumegwu, nke aha otutu ya bụ Odumobi nke isii na Idoeri Kingdom sị na "ihe ndị ahụ mere nwaagbọghọ ahụ na-agba anyammiri".

Ọ sị na "ọ bụ amaghị ihe ka ha jiri bo nwaanyị ahụ ebubo ndị ahụ na-abụghị eziokwu".

Ọdụmobi na-akọwa na akụkọ niile ahụ na-efegharị na soshal midia gbasara nwaamadị ahụ nwụrụ na nwunye ya ahụ a gbara ọtọbụ akụkọ ụgha.

Nwanne di nwaanyị ahụ na-ebo ya na ihe nwanne nwoke ya jiri nwụọ bụ maka na ọ na-agba n'ezi, dịka omenala chere.

Ọdụmobi sị na iwe dị ndị Aguleri n'obi maka ya bụ ihe ndị ahụ mere nke bụ na "ha chọbụrụ ịjide ndị ahụ mere ya bụ ihe, gbaa ha ọtụ etu ha siri gbaa ya bụ nwaanyị, kpụgharịa ha, mana ha sịrị na arụ abụọ agaghị eme otu mgbe".

Ọdụmobi na kwukwa na iwe ya bụ na ndị ahụ hapụrụ onye gburu mmadụ ga-gbawa nwaanyị mmadụ ọtụ

"Ọ bụghị omenala anyị, ọ bụ onye zuru ohi ka a na-agba ọtọ."

Ọ gara n'ihu kwuo: "Ọtụtu n'ime ndị ahụ mere nwaanyị ahụ ihe ahụ na-adịna nwoke ọzọ, ma ọnwebeghị onye gbara ha ọtọ".

Odumobi

Ebe foto si, Odumobi

Nkọwa foto, Odumobi bụ onye enyemaka Eze Chukwuemeka Eri na ihe gbasara njem nleta na omenala

Ọ sị na ha gbara mbọ ịkwụsị ụmụnwanne nke nwaanyị ịbọ ụbọ ihe e mere nwanne ha nwaanyị.

"Mana ọ gaghị agacha abalị anọ unu anụ ihe ndị Aguleri ga-eme".

Odụmobi kọwakwara na nke bụ eziokwu bụ na di nwaanyị ahụ bụ Udọjị nke aha otutu ya bụ Otigbu bụ onye na-eti egwu n'obodo nke onye ọbụla ma.

Ọ sị na nsogbu Udọjị bụ na ọ naghị atụwalị nwaanyị ime.

Ọ sị na Udoji alụọla nwaanyị ugboro ugboro mana ọmụtalighị nwa.

O kwukwara na ụmụnwaanyị ndị a anaghị nọli maka nke a.

Ka o siri kwuo, Udoji gaziri lụta nwaanyị nke a bụ nke dị ime bata be ya were nọrọ.

Aha onyonyo, Ọgbaghara sochiri echichi Igwe Aguleri ọhụrụ

Ọdụmobi kọkwara na agbanyeghị na ya bụ nwa nke nwunye ya bu afọ ime ya bata mechere nwụọ afọ anọ gara aga, ha abụọ nwere nghọta maka ịmụta nwa ọzọ.

Ọ sị na ya na nwunye ya ghọtara nsogbu diiri ha mana ụmụnna nke nwoke anabataghị otu ha si ebiri.

Nke a mere ha jiri kpọọ nwaanyị ahụ asị dịka nwaanyị na-agba na-ezi na-achọzị ohere ha ga-eji mesie ya ike.

Ọdụmobi sị Udoji anwụghị n'elu nwunye ya ka ọ ụfọdụ sị ekwu.

Ọ sị na Udoji dara ọrịa ihe karịri izụ abụọ gara aga.

Ọ sịkwa na ha na-eche na ọ bụ "lassa fever" gburu Udoji maka na ọ gara tie egwu n'Eziagulu Otu, Aguleri ebe ya bụ ọrịa gbugoro ihe ruru mmadụ iri atọ (30).

Ọ sị na Udoji gara egwu n'Eziagulu Otu abalị atọ tupu ọ daa ọrịa.

Ọdụmobi che na ọnwụ Udoji bụ ohere ụmụnna ya nwere iji chụpụ nwunye ya ahụ ha chere na-agba n'ezi.

Aha onyonyo, Kedu ebe Igbo si?

O kwukwara na nwaanyị ahụ a gbara ọtọ efughị efu dịka ndị mmadụ si ekwu na soshal midia, kama ọ bụ ụmụnwanne ya kpọrọ ya zoo maka ihe ihere mere ya.

Ọdụmobi sị na onye uweojii bịara ịzọpụta ya bụ nwaanyị n'aka ndị gbara ya ọtụ, ndị ahụ dọkara akwa ya, "mana ha agbaala ọsọ ugbua maka na ha ma ajọ ihe ha mere".

Ihe nwaanyị a gbara ọtọ kwuru?

Mana n'ajụjụ ọnụ ndị Aguleri World Forum gbara nwaanyị ahụ a gbara ọtọ, ọ kọwara na ndị be dị ya na-ebo ya ebubo ịdịna nwoke ọzọ maka na afa obodo ha kwuru na ya na nwoke ọzọ na-anyị bụ nke mere dị ya ji daa ọrịa.

O kwetakwara na ọ nwere nwaamadị na-abịakwute ya n'abalị ụfọdụ mgbe di ya ka dị ndụ, mana ọ dọrọ ya aka na ntị ya abịzịla.

Nwaanyị ahụ kwukwara na ya bụ nwaamadị na-akpasa ya ajọ agwa mgbe ụfọdụ nke o kwuru na ọ gwaghị di ya maka ihe ya na nwoke ahụ na-eje.

Nwaanyị ahụ kwukwara na ọ nọ be nwanne ya ugbua.

Nke gbara ama na akụkọ na ụmụnne ya zoro ya ezo bụ eziokwu

Aha onyonyo, Emume 'Olili ọnwa isa' Eziagulu Aguleri nke afọ 2020 kporo ọkụ, Kirie ka o si gaa

Nwaanyị ahụ na-ebo ebubo na ọ bụ nwanne di ya ṅụrụ mmanya bụ ihe tigbụrụ di ya ka ha si ebe ha gara alọta.

Ọ sịkwa na ọ bụ mgbe ha n'alọta ka ụmụnwaanyị ndị ogbe ha kpụpụtara ya n'ụgbọala gbaa ya ọtọ, tiwa ya ihe.

Agulewri

Ebe foto si, Odumobi n'Aguleri

Aha onyonyo, Akụkọ a mara ime n'ala ịchọpụta ebe Igbo si