International Women's Day: Ihe mere ụmụnwaanyị ji eme ngagharịiwe na Naịjirịa taa

Mgbe e biputara ya

Taa bụ ụbọchị asatọ n'ọnwa Maachị bụ ụbọchị ncheta ụmụnwaanyị na mbaụwa dịka ụmụnwaanyị ji ohere a ekwu echiche gbasara onwe ha nakwa ọdịmma ha.

Mana nke afọ 2022 a pụruiche dịka ọtụtụ ngagharịịwe na-akpọtụ n'akụkụ Naịjria dị ịcheịche.

Gịnị mere ụmụnwaanyị ji eme nghagarịiwe?

N'ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị 2022 ka chi jiri n'ehihie ebe ụmụnwaanyị Naịjrịa nọ.

Ndị omeiwu Naịjirịa kwụ ọtụ kagbuo akwụkwọ iwu gbasara ọdịmma ụmụnwaanyị na Naịjirịa.

N'ime iwu iri isii na asatọ (68) ndị omeiwu Naịjirịa megbarịri, ise nke gbasara ụmụnwaanyị achịtaghị aja.

Ya bụ ihe gbakara ụmụnwaanyị isi na Naịjirịa.

Silvia Abana, onye bụbu onyeisi ngalaba ndị ọkaiwu ụmụnwaanyị bụ International Federation of Women Lawyers (Fida) kọwara ihe a mere dịka "Ogbunigwe ka ha tụrụ".

Iwu ise (5) gbasara ụmụnwaanyị so na iwu iri isii na asatọ (68) ụlọ omeiwu Naịjirịa lebere anya

1. Ụmụnwaanyị Naịjirịa chọrọ ka ahapụrụ ha oche 111 n'ime ụlọomeiwu 109 ndị Sịnatị nwere na 360 dị n'ụlọomeiwu nta.

2. Ọzọ bụ iwu gbasara 'citizenship' nke chọrọ ka nwaanyị keta oke na steeti di ya dịka.

3. Ọzọ yiri ya bụrụ ka nwoke onyeocha nụrụ onye Naịjirịa keta oke na Naịjirịa dịka nke nwaanyị ga-esi keta ma nwoke nụbata ya.

Iwu a yiri ibe ha dara n'ụlọomiwu nta ma gafee n'ọlụomeiwu ukwu.

4. Ọzọ bụ iwu nke sị ka enye ụmụnwaanyị 35% n'ọkwa ọrụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa.

Iwu nke adanyụrụ anya n'ụlọomeiwu abụọ a.

5. Iwu ọzọ chọrọ ka ahapụrụ ụmụnwaanyị ọgwa n'ọrụ gọọmentị (minista na kọmishọna).

Nke a gafere n'ụlọomeiwu nta ma danyụọ anya na sinet dịka ọbaozi ndị Policy and Legal Advocacy Centre (PLAC).

Gịnị ka ụmụnwaanyị na-eme gbasara nke a taa bụ ụbọchị ncheta ha

Kemgbe iwu ndị a dachara mmiri n'ụbọchị mbụ nk'ọnwa Maachị, ụmụnwaayị malitere ịkatọ ya bụ ihe ma tikwaa aka n'obi igosi iwe ha.

Nke a mere ọtụtụ ụmụnwaanyị ji pụta n'ọtụtụ ebe ịme ngagharịiwe.

Ọdịdị a wutere ụmụnwaanyị nke ukwuu nke bụ na ụfọdụ ha sị: "ụmụnwoke egosila na anyị bụ ndị iro ha".

Ụfọdụ kwukwara "nke a gosiri na ụmụnwoke Naịjirịa na-atụ anyị egwụ".

PLAC na ọba ozị intanetị ha "sị na ya bụ iwu ndị a, ọ bụrụ na ha gafere, kaara itinye ụlọomeiwu nke itoolụ ezigbo aha".

Ụmunwaanyị Abuja

Ndị bụ ngagharịiwe nke Abụja n'isi bụ ụmụnwaanyị ndị otu National Women Commission of the Nigeria Labour Congress nke nwaada Mercy Okezie nọ n'isi ya.

Mercy sị na "otu e si eleghere ụmụnwaanyị anyị adịghị mma maka na nwoke na nwaanyị bụ otu".

Ọ sị na nghọtaghe nọ n'ime ọtụtụ okpukperechi na ihe ndị ọzọ anaghị ekwe ka ụmụnwoke kweta na mmadụ ọkachasị ụmụnwaanyị bụ mmadụ.

Ụmụnwaanyị Umuahia

Ụmmụnwaanyị n'isi obodo Abia steeti bụ gbakọrọ na obi ụmụnwaanyị bụ Women Development Centre ebe ha nọ tịnye ọnụ n'ọkwụ gbasara ha na-arịọ ka a kpụọ ha isi akpụrụ Alịbatị.

Nwunye Gọvanọ Abịa steetị bụ Deaconess Nkechi Ikpeazu sọ na ya bụ okwu dịka ọ pụtara nwado ụmụnwaanyị ibe ya.

Oriakụ Ikpeazụ sị na "ndị omeiwu adochiela ụmụnwaanyị azụ ọtụtụ afọ" maka ya bụ nkwado ha jụrụ ịnye ha.

Ọ sị na ụmụnwaahị agaghị ezuike rụọ mgbe ha tinyere aka na ya bụ akwụkwọ.

Oriakụ Ikpeazụ tiri aka n'obi na ya ga-ahụ na ndị otu ya bụ Economic Empowerment for Women agaghị ekwa ka ya bụ ọkụ nyụlahụ ha.

Ụmụnwaanyị ndị nkwarụ bịakwuru ya bụ ọgbakọ.