You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gịnị dị n'ime iwu ọhụrụ gbasara ọnụọgụgụ Naịjirịa Onyeisiala Buhari kpuhere ụnyaahụ?
Ụnyaahụ bụ Tọzde, ụbọchị atọ nke ọnwa Jenụwarị ka onyeisiala Muhammadu Buhari na Osote ya bụ Yemi Osinbajo kpuhere iwu ọhụrụ ga-echekwa ọnụọgụgụ n'isi ụmụ Naịjirịa ha kpọrọ "Revised National Policy on Population for Sustainable Development".
N'ozi ọhụrụ ha weputara na Twitter ha, ụlọọrụ ndị isiọchịchị si na ya bụ iwu ọhụrụ na-etinye anya n'ụzọ ọgbara ọhụrụ e ji egbochi oke ọmụmụ, ọkacha ugbua Naịjirịa nọ na mkpa.
Ya bụ akwụkwọ ga-agbado ụgwụ n'usoro ọgbaraọhụrụ eji ahazị ọmụmụ bụ 'modern contraceptive methods' na Bekee.
N'otu ụbọchị ahụ, onyeisiala Naịjria bụ Muhammadu Buhari hiwere otu kọmitii ọrụ ha ga-abụ ikpokoba iwu na ọrụ n'ụdị ga-eme ya ka o yie ihe.
Ha kpọrọ ya bụ kọmitii "National Council on Population Management (NCPM)" na Bekee.
Ọ bụ onyeisiala Muhammadu Buharị na Osote ya bụ Yemi Osinbajo bụ ndị isi na ya bụ Kọmitii.
Ndị so na ya bụ otu bụ ndị isiọrụ na ministri ya bụ ọrụ ọnụọgụgụ gbasara.
Onyeisiala nwere olile anya na ọrụ ndị a ga-enyeaka ịme ka ndụ dịara ndị mmadụ nfe na Naịjirịa gbaa gburugburu.
O kwukwara na "Iwu ọhụrụ a ga-enyeaka ịbelata oke atụime site na iji ụzọ ọgbara ọhụrụ "family planning", ịgbazi ụzọ, ịhazị ọmụmụ nakwa ịme ka a zụta akụrụngwa e ji arụ ya bụ ọrụ".
Ọ sịkwa na ọ ga-enyeaka ịkwalite ahụike nne na nwa na ndị ọzọ.
Ọ na-akọwa na imilikiti ndị Naịjirịa bụ ndị ntorobịa ka na-amụ nwa kwesiri itinye uche n'ịhazị ọmụmụ.
O kwukwara na ọ dị oke mkpa itinye iwu ọhụrụ a n'ọrụ maka ịkwado ịgụ ọnụ isi ndị Naịjrịa n'afọ 2022 a.
Lee ihe atọ gbara ọkpụrụ anyị ma dị n'ime ya bụ akwụkwụ ahụ
- Gọọmentị ga-abado usoro na ihe ndị e ji ahazị ọmụmụ nke Bekee kpọrọ "Contaceptives".
- Akwụkwọ ahụ kwadoro usoro ịgbasa ọmụmụ nke Bekee kpọrọ "Child Spacing".
- A ga-enwe ndị na-agbaziri ezinaụlọ ụzọ nke ga-enyere ha aka ịhazị ọmụmụ na be ha a kpọrọ "family planning counselling'.