'Arụ na-eme n'ala Igbo bụ 'cancer' aga awapụ' - Asari Dokubo

Ebe foto si, Getty Images
Asari Dokubo bụ onye ama ama na agha nnupuisi na Naịjirịa kọwara otu ogbugbu mmadụ nakwa ọnọdụ enweghị nchekwa n'ala Igbo dịka akpụ "cancer" e kwesiri ịwapụ ozugbo ozugbo.
Dokubo bụ onye kọwara onwe ya ka nwaafọ Igbo aha nnanna ya bụ Ediabalị katọrọ ajọ ihe niile na-eme na ala igbo na-ekwu na okenye ekwesighị ịnọ n'ụlọ ewu amụọ n'ọgbụ.
Ọ kọtọrọ ndị niile nwere agba n'ala igbo maka ịgba nkịtị ajọ ihe dị otu a, bụ nke ọ na-ebo ndị otu Indigenous People of Biafra, Ipob, na-eme n'ala Igbo, maka egwu ha na-atụ.
Asari sị "anaghị m atụ onye obula egwu maka na ọnweghị ihe ha ga-eme m".
Ọ sị na ya ga-eso ndị ọrụ nchekwa hụ na-achụpụchara ndị ọjọọ na-egbu mmadụ n'ala Igbo.
"Ala Igbo bụ be anyị, anyị agaghị ahapụ ndị ajọọ mmadụ ka ha bịa were ọnọdụ".
O kwuru na ndị niile na eme ndị mmadụ agala ọrụ maka "sit-at-home" achọghị ọdị mma ndị Igbo.
Asari sị na ihe abụọ e jiri mara Igbo bụ azụmahịa na ịga akwụkwọ, na ndị ajọ otu a anapụchaala ha ya.
O kwuru na ọtụtụ mmadụ esichaal n'ala Igbo gbaa ọsọ maka enweghị nchekwa ebe ahụ.
O kwukwara ndị ọzọ na-ere ụlọ ha na-agbapụ ọsọ ebe ha na azọ isi onwe ha.
"Unu a sị m ekwula okwu? agaghị ma akpa nkịtị mana ọ bụghị naanị ha ma achụ mmadụ".
Asari Dokubo sị na esemokwu ya na Nnamdi Kanu malitere ka e mechere ntuliaka ndorondoro ọchịchị n'Anambra na 2014.
O kwuru na ya na ndị be Nnamdi Kanu akpaala kemgbe e jidechara ya.
Ọ sị na ha rịọrọ ya ka ya aghara ịme ihe ọbụla ga-eme ka gọọmenti Naịjirịa ghara ịhapụ ya.
"Mana ndị otu Nnamdi kanu achọghị ịhapụ m aka. Ha na-akọtọ m. Mana ndị ahụ bịara rịọ m enweghị ike ijideli ha".
Asarị sị na "ahụla m ihe n'ụwa. Abaala m n'ọnụ ọnwụ pụta maka na onwere ihe Chineke chọrọ ka m mee".
Ọ gbagwojuru ya anya ka ndị mmadụ si egbu ụmụnne ha maka ha na-achọ Bịafra.
O kwuru na ọtụtụ ndị niile bụ ndị ọrụ nchekwa a ha na-egbu bụ ndị Igbo, ha abụghị ndị agbụrụ ọzọ.
Dokubo bụ onyeisi ndị Biafra Defacto Government sị na ya na-ekwu uche ya n'okwu a, na ọ bụghị uche ndị Defacto Government.
O kwuru na ọ bụ eziokwa na ndị Defacto Government achọghị ka ya na-ekwu ụdị ihe a mana ya agaghịzị agba nkịtị.
Asari si na ya so gbaa mbọ ihu na ntuliaka Anambra gara were were.
Gịnị mere Asarị ji aba mba?
Ọtụtụ mmadụ anwụọla maka ọgbaghara na-ada n'ala Igbo kemgbe afọ abụọ ugbua.
Gọọmentị Naịjirịa na-ebo ndị otu Ipob ebubo ibute ya bụ ọgbaaghara maka mnwereonwe ha na-azọ.
Otu Ipob chọrọ ka ndi Igbo si na Naịjirịa pụọ mana Naịjirịa ekweghị.
Ha kwenyere na a na-emegbu ha emegbu na Naịjrịa.
Nke a abụghị mbụ nsogbu dapụtara maka ndị Igbo chọrọ ipụ na Naịjriịa.
Asiri Dokubo sị na ya ekwegheghị otu Ipob si alụ ọgụ mnwereonwe.
Ọ sị na ya na Nnamdị Kanu bụ onye ndu Ipob malitere ise okwu gbasa nke a kemgbe 2014.
Ọnụ na-ekwuru otu Ipob bụ Emma Powerful, agwala BBC ugboro ugboro na ha emechiela ọnọdụ onye apụla ezi ha tinyeburu.
O kwukwaala na aka ha adịghị n'oke ogbugbu mmadụ na-akpọtụ n'ala Igbo.
Onye bụ Asari Dokubo?
Asari Dokubo bụ onyeisi otu Ijaw Youth Council ma bụrụ kwa onye bidoro Niger Delta People's Volunteer Force bụ otu ji ike ekwupụta ihe ha chọrọ n'aka gọọmentị.
A mụrụ ya n'ọnwa Jun afọ 1964.
Aha ya bụbu Melford Dokubo Goodhead nke ọbere kama ọ mechara tụgharịa aha ya were zawa Mujahid Dokubo-Asari mgbe ọ banyere okpukpere Alakụba.
N'afọ 2013 ka Dokubo bụrụ onye mba Bene repụblịk ma were akụnụba ya gaa mba ahụ.

























