Jim Iyke and Uche Maduagwu: Ugboro ise ndị a ma ama jiri ịtụ asị rafuo ọha na soshal midia

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Ọtụtụ ndị a ma ama na Naịjirịa nakwa na mbaụwa emela ihe ndị mmadụ ji akpụ ha n'ọnụ ụfọdụ oge.

Ụfọdụ ha na-akpacha anya mee ihe ga-eme ka ha bụrụ isiokwu nkata ndị mmadụ.

Ụfọdụ oge ọ na-adabara ha mana ụfọdụ oge ndị ọzọ, ọ na-aghọ ha ahịa ma a chọpụta na ihe ha mere maọbụ kwuru abụghị eziokwu.

Akụkọ a na-achịkọtara gị ugboro ise ndị a ma ama na Naịjiria tụrụ asị wuru ewu na soshal midia tupu e mechaa chọpụta na ọ bụ asị.

Ndị a ma ama tụrụ okpotokpo asị wuru ewu

1. Jim Iyke

Jim Iyke bụ otu onye welitere isi na ndị ejije Naịjirịa a kpọrọ Nollywood.

O meela ọtụtụ ejije dị icheiche ebe ọ bụ onye isi nkụka nke mere na ndị mmadụ na-eche na ọ dị etu ahụ n'ihe.

N'ọnwa Ọgọst afọ 2021, ihe onyonyo pụtara na soshal midia ebe ọ dịka ọ na-emepụta ihe ọ na-eme n'onyonyo dịka onyeisi nkụka. Onyonyo ahụ pụtara gosiri ebe ọ na-eti Uche Maduagwu bụkwa onye na-eme ejije ihe n'ihi mkparị ọ sị na ọ kparịrị ya.

Maduagwu bụ otu onye na-emekwa ejije a ma ama dịka onye na-akatọ ndị mmadụ na soshal midịa. O kwuola ọtụtụ ihe dị icheiche megide mdị mmadụ nke ndị mmadụ ji akpụ ya n'ọnụ ọtụtụ oge.

Uche Maduagwu bupụtara akụkọ na soshal midia na-atụ Jim Iyke aka ka ọ kọwaa ebe ego ya si. O kwuru na Jim Iyke na-eme okomuko karịa etu o siri kwesi, na-atụ aka na ọ bụghị naanị ejije na-enye Jim Iyke ego, kama ka Iyke kọwara ọha ebe o si enweta ego ọ na-akwari na soshal midia. Madụagwu kwuru a ya onwe ya na-emekwa ejije mana ya anaghị ahụ maọbụ egosipụta ego etu Jim Iyke si egosi ya.

Ọ na-ajụ ma 'ọ bụkwa ejije a ya na-eme ka Jim iyke na-eme jiri na-egosi ego niile a na soshal midịa.'

Okwu ya ahụ amasịghị jim iyke chacha nke mere na o rughi ụbọchi ole na ole Maduagwu kwuchara ihe ndị a na soshal midia, onyonyo apụta ebe Jim Iyke wakporo ya iti ya ihe.

Ọ dịkwa mkpa ịmata na Jim Iyke wepụtara ihe ejije ọhụrụ oge ahụ ọ kpọrọ 'bad comments'.

Ejije ahụ bụkwa maka ndị na-anọ na soshal midịa akọ ndị mmadụ ọnụ ma na-ekwutọ ndị mmadụ.

Nke a mere o jiri ọ gbagwojuo ndị mmadụ anya ka ọ bụ ejije ya ka ọ na-akwado mere o jiri wakpoo Maduagwu.

BBC Igbo gbara Jim Iyke ajụjụọnụ oge ihe a mechara ịma ka o tiri Maduagwu ihe n'ezie, Jim Iyke kwuru na ọ bụghị n'ihi ejije ahụ o wepụtara (bụ nke gbasara iburu ọgụ gakwuru ndị na-akparị mmadụ na soshal midia) ka o ji tie Maduagwu ihe.

N'ihe dịka ntụgharị ihe mere, oge ndị mmadụ dịka ha echefuola maka mwakpo ahụ mere, onyonyo ọzọ pụtara n'abalị ise nke ọnwa Jenụwarị 2022 ebe Jim Iyke na-ekwu na e tiri ihe e tighi ihe bụ nghọgbu ka ha ghọgburu ndị mmadụ.

Jim Iyke kọwara na ya na Maduagwu nọrọ ala kpaa nkata maka etu ha ga-esi ghọgbuo ọha, iji kwalite akụkọ gbasara ya bụ ihe onyonyo ya ahụ.

Uche Maduagwu n'onwe ya kwuru na ihe ahụ niile bụ iji kwalite onyonyo ahụ dịka jim Iyke kwụrụ ya ihe karịrị nde naịra anọ iji kwalite onyonyo ahụ.

Nke a abụghị mbụ Uche Maduagwu na-eme ụdị ihe a mere e ji enyozi ya enyo oge ọbụla o mere ihe.

2. Blessing Okoro (Blessing CEO)

Blessing Okoro Nkeiruka nke e ji Blessing CEO mara wuru ewu n'afọ 2019 mgbe ọ gwara ndị mmadụ na ọ rụrụ nnukwu ụlọ mara mma n'Enugwu bụ isi obodo Enugwu steeti na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Okoro bụ onye a ma maka ikuziri ndị mmadụ gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị, kwuru na o ji okwute ahụhụ a tụrụ ya mgbe ọ nọ na di, wuo ụlọ ya.

Blessing na di ya gbasara alụmdi ha nke Blessing kwuru na mgbasa ahụ zọrọ ndụ ya.

O kwuru na mgbasa alụmdi ahụ mere ya ji jiri ọsịịsọ na ọbara ya rụọ ụlọ ya iji mechapụta onwe ya ihu.

Oge Blessing mere ncheta ọmụmụ ya nke afọ 30, o sere foto n'ihu ụlọ ahụ o kwuru bụ nke ya tinye n'Ịnstagram dee na ọ bụ onyinye ya nyere onwe ya na ncheta ọmụmụ ya.

Mana ebe nsogbu dị bụ na ụlọ ahụ o gosiri abụghị nke ya n'ezie, ọ bụ ụlọ onye achụmntaego Igbo bi na mba Chaịna aha ya bụ Onye Eze.

Mgbe foto ụlọ ahụ zuru ịntanetị niile, ndị mmaọ̄ụ malitere ịkpọpụta Blessing na ụlọ ahụ abụghị nke ya.

Akụkọ kwuru na ọ bụ nwanne Onye Eze bụ onye buru ụzọ tipu mkpụ na ọ bụ ụlọ nwanne ya nwoke.

Agbanyeghi nke a, Blessing gara n'ihu na-ekwusi ike na ụlọ ahụ bụ nke ya.

O gbughi oge ihe ndị a na-eme, foto apụta gosi ebe a nwuchiri Blessing tụọ ya ịga n'aka dịka onye nwe ụlọ ahụ kwuru na ọ bụ ulọ ya ka Blessing ji eko na soshal midịa.

Foto a gosiri Blessing ebe ọ gba ịga n'aka ụbọchị onye nwe ụlọ bụ Onye Eze chọpụtara ya maka itinye ụlọ ahụ na-abụghị nke ya na soshial midịa.

Akụkọ kwuru na ndị otu Onye Eze nwuchiri Blessing ma tie ya ihe tinye ya na soshal midia nke mere e ji kpụrụ ya n'ọnụ.

Blessing mechakwara rịọ ka ndị na-akwado ya gbaghara ya n'agwa ahụ ọ kpara.

3. Halima Abubakar

Halima Abubakar bụ onye na-eme ihe nkiri na Naịjirịa tinyere foto nwata onye ọcha a mụrụ ọhụrụ n'Instagram n'afọ 2020.

Oge a ka akụkọ pụtara na ya bụ nwaanyị na-eme ihe ejije na Nollywood mụrụ nwa ọhụrụ.

Foto a bọliri uzu maka ọtụtụ ndị mmadụ chere na o tinyere ya iji kwụpụta na ọ mụọla nwa ọhụrụ n'ezie.

Mana nsogbu dapụtara oge nwaanyị a kpọrọ Ariel bụ onye Amerịka kwuru na foto Halima tinyere bụ foto nwa ọhụrụ ya bụ Ariel.

Nwaanyị gbadosiri ụkwụ ike gwa Halima ka o kwụsị ụdị omume ahụ ma wepụ foto nwa ya n'Ịnstagram ya.

Halima mechara rịọ ndị na-eso ya mgbaghara ma wepụ foto ahụ.

O depụtara ozi n'akara ya na soshal mịdịa kwuona ihe kpatara ya jiri mee ụdịrị omume ahụ bụ maka na ya esebeghi nwa nke ya foto kama na ya mụrụ nwa ọhụrụ n'ezie.

4. Harrysong

N'otu aka ahụ, otiegwu a ma ama na Naịjirịa bụ Harrison Tare Okiri nke e ji aha egwu ya Harrysong mara gosiri foto ụmụejima abụọ n'akara ya n'Instagram n'afọ 2017.

Foto ahụ wuru ewu nke ukwuu nke bụ na ọtụtụ ndị mmadụ zigara ya ozi ekele maka ụmụ ọhụrụ ya.

O kwuru na ọ bụ enyi ya nwaanyị bi Abuja oge ahụ mụọrọ ya ejima nwoke na nwaanyị aha ha bụ Perez na Tare.

Mana e mechara nke ahụ bụrụ asị ọcha. N'ọnwa Jenuwarị afọ 2022, ọ gwara ndị na-eso ya na nwa nwaanyị ọhụrụ bụ Daviva nke nwunye ya mụrụ bụ nwa mbụ ya.

N'okwu ahụ o depụara n'akara ya, Harrysong dere 'abụghị papa ejima. O nweghi ejima ọbụla dị, o nwebughị mgbe ejima dị. Nwaanyị ahụ amụghịdị nwa cha cha. ọ tụrụ asị na-eri ego m. Nwa mbụ bụ Daviva.'

BBC Igbo chọpụtara na Harry Song, Halima Abubakar na Blessing Okoro CEO ewepụla ebe ha gosipụtara ihe ndị a na soshịal midịa.