You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kidnapping in Imo State: Aka akparala ụkọchukwu na ndị otu ya tọọrọ Fada Katọlik n'Imo Steeti
Ndị uweojii Imo Steeti sị na aka ha akparala otu onye ụkọchukwu na ndị otu ya so tọọrọ otu Fada ụka Katọlik dị n'Umunohu Amakaohia nke okpuruọchịchị Ihitte/Uboma.
Aha ụkọchukwu a Izuchukwu Anoloba gbara afọ iri atọ na ise ebe Fada ha tọọrọ bụ Fidelis Ekemba dị afọ iri anọ na ise.
Mgbe a na-agba ndị a n'anwụ, ndị uweojii sị na ndị kpachiri Fada ahụ karịa ụbọchị asaa ma nara nde naịra ise n'isi ya.
Kọmishọna Uweojii n'Imo Steeti bụ Rabiu Huissani sị na a ma ndị otu ama dịka ndị na-akpa ike dị egwu.
Ọ sị na a nwuchiri ụkọchụkwu ahụ na Legọs Steeti site na mbọ ndị ọrụ nchekwa ngalaba na-ahụ maka ntọrị mmadụ gbara.
Mgbe onye ụkọchukwu Anoloba na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ, ọ sị na o ritere otu nde naịra na puku narị ise n'ego ahụ.
N'okwu ya "Abụ m ụkọchukwu n'otu ụlọụka dị na Legọs, amaghị m na aka ga-akpara m.
Ihe a m mere na-ewute m maka na ọ bụ ihere nyo nzukọ Kraịst nakwa ezinaụlọ m".