South-East Governors Meeting: Ebe anyị kwụ maka ogbugbu ndị uweojii nakwa mkpụrụmmiri

Mgbe e biputara ya

Ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ akatọọla ihe onyonyo gosiri ebe ndị ntoroọbịa sịrị na ha bụ ndị Ipob/ESN gburu ndị uweojii abụọ ma bepu ha isi.

Ha sị na ha ga-eme nyocha ịmata ma ihe onyonyo ahụ ọ bụ eziokwu site n'enyemaka ndị ọrụ nchekwa ma taa ndị kpara arụ a ahụhụ.

Nke a dị n'ozi ha wepụtara na ngwụcha ọgbakọ ha mere n'onyonyo ịntanetị bụ 'virtual meeting' na Tuzde.

Ndị gọvanọ a sị ha ga-ebuagha megide ịṅụ ọgwụike ọkachasị mkpụrụmmiri, na onye ọbụla a hụrụ na-ere ya ga-ahapụrụ gọọmentị steeti ụlọahịa ya, tinyekwara na a ga-ata ya ezi ahụhụ.

Ha kwukwara na mbọ na-aga n'ihu ịtụte ndị niile ọgwụike larala n'iyi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Ha gwara ndị ndu obodo kpọọ ekwentị ndị ahụ e nyere ha na nzuzo mgbe ọbụla ha hụrụ onye na-ere maọbụ na-aṅụ ọgwụike.

Ha kelekwara ndị ntoroọbịa maka udo nke weere ọnọdụ ugbua n'Ọwụwa Anyanwụ ma rịọ ndị ọbụla ka bu egbe ka ha biko wụsaa ngwa ọgụ.

Ha dọrọ ndị ekperima ji aha IPOB/ESN akpa arụ n'ala Igbo ka ha kwụsị ngwa ngwa, ma sị na ha maara na ọnọdụ nchekwa akarịala okwu IPOB/ESN.

Ha sị ndị nwere iwu n'obi dere jụụ na ha na-enyocha ka o si aga ma sị na ọ bụ ihe a ga-eji nwayọọ kpaa nkata banyere ya.

Ha gwara onye ọbụla gawa mkpa dịịrị ha n'ụbọchị Mọnde ọbụla na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Etu ndị oji egbe jiri gbuo ndị uweojii bepụ ha isi n'Anambra - Ndị uweojii

Ihe onyonyo na-efegharị na WhatsApp ugbua na-egosi ebe ndị omekome ji isi mmadu ha bepụrụ na-eme akaja.

Ndị uweojii sị na ndị ahụ e bepụrụ isi bụ ndị otu ha e gburu egbu.

N'ihe onyonyo ahụ BBC Igbo hụrụ, ndị ji egbe nọ n'okpuru ụzọ ebe ha gosiri ndi uweojii ha gburu ma na-ekwu na ha bụ ndị "ESN".

Ndị ahụ ji egbe nọ n'etu na-asị: "ESN ESN, anyị na-aga, anyị na-aga... anyị na ndị a akwala mgbọ ugbua, anyị agbajaala ha ahụ."

Ha nọkwa n'onyonyo ahụ na-ekwu ka ewete mma ka ha "gbupu isi" mmadụ abụọ ahụ ha gburu.

Onyonyo ọzọ gosiri ndị a na-eche na ọ bụ otu ndị oji egbe ahụ ebe ha bu isi mmadụ abụọ ha bepụrụ.

Ndị ahụ egburu yi uwe ndị uweojii Naịjirịa.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ndị ahụ bụ ndị uweojii sị ụzọ Azia aga Orsumoghu tupu ndị ojiegbe awakpoo ha ma gbuo mmadụ abụọ n'ime ha.

Maazị Ikenga kwukwara na a ka na-achọ otu onye n'ime ndị uweojii ndị ha so na ndị nọ na njem ebe ahụ achọ.

Ọ kwukwara na ụfọdụ ndị otu ha gbara ọsọ ma gbapụta mmadụ abụọ n'ime atọ bụ ndị nkiti na-akwọ ụgbọala so na ya bụ njem mgbe a wakporo ha.

Maazị Ikenga sị na mgbe ha nụrụ akụkọ ihe a mere, ha zigara ndị otu ha ebe ahụ maka nchekwa udo na igbapụta ndị e ji eji.

Ọ sị na ndị ojiegbe a tụkwara ogbunigwe n'ụgbọala ndị uweojii.

Dịka o siri kwuo, ndi uweojii napụrụ ndị omekome a egbe abụọ nke ha zuru n'aka ndị otu ha.

O gara n'ihu dee: "Enweghi ndị nkiti nọ ebe ahụ mgbe anyị busoro ndị omekome ahụ agha ma ọfọdụzie ụmụaka ọbụla".

O kwuru nke a maka ebubo na ndị uweojii gburu nwa agbọghọ n'obodo Azia nke kpatara ndị obodo ahụ jiri mewe ngagharị iwe.

Na nchịkọta akwụkwọ ozi a rụrụ ndị omekome ahụ aka dịka ndị nwereike igbu ya bụ nwaada ebe ha na-akwa mgbọ aghara aghara ebe ahụ.

Gịnị jịkọrọ akwụkwọ ozi ndị uweojii na ihe onyonyo a na-efeghari?

Ihe onyonyo ahụ gosiri ndị uweojii abụọ egburu ma tụkwasi 'taya' ụgbọala n'elu nke gosiri na-achọrọ igba ha ọkụ.

Akwụkwọ ozi ndị uweojii kwuru na egburu ndị otu ha abụọ ma gbaa ha ọkụ.

Ihe onyonyo nke abụọ gosiri ebe ndị omekome ahụ ji isi mmadụ abụọ ha si bụ ndị uweojii. O gosikwara otu onye n'ime ha e ji eji.

Akwụkwọ ozi ndị uweojii kwuru na a ka na-achọ otu onye n'ime ndị otu ha achọ.

Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe ndị omekome ahụ na-agwa na otu onye n'ime ndị uweojii ahụ ka ọ gbapụ oso dịka ha egbughi ya.

Akwụkwọ ozi ndị uweojii kwuru na otu onye n'ime ndị otu ha gbara ọsọ.

Anambra Steeti so na mpaghara Ọwụwa Anyanwu Naịjirịa bụ mpaghara ndị ojiegbe amabeghi ndị ha bụ na-awakpo ndị mmadụ aghara aghara.

Ndị a na-agba ụlọ ọkụ ma na egbọ ndị mmadụ aghara aghara.

Gọọmentị na ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ebọ ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) na ngalaba nchekwa ha bu "Eastern Security Network" ebubo na ọ bụ ha na-akpa ike a niile, mana Ipob na-agọsị ike n'aka ha adịghị na ya.