Ndị a na-enyo na ha bụ ndị 'unknown gunmen" dọwara igbe ozu na isi mmadụ n'ahịa Afọ Nnobi

Ebe foto si, Getty Images
Egwu ji ndị Nnobi na ndị bi na gburugburu obodo hụ ozu mmadụ abụọ nakwa akpati ozu a dọwara n'ahịa Afọ Nnobi dị n'Okpuru Ọchịchị Idemili South dị n'Anambara steeti.
Otu onye ntaakụkọ bi n'obodo ahụ achọghị ka a kpọ aha ya kwuru na "ndị mmadụ tetara ụra n'ụtụtụ Fraide hụ ozu mmadụ abụọ na igbe ozu."
"Etu ọnọdụ ha dị gosiri na a gbagburu ha agbagbu."
"O nweghị onye ma ndị gburu ha maọbụ ihe e ji maka ya gbagbuo ha."
Ọ gara n'ihu kwuo na onye ọbụla a jụrụ ihe ọ ma maka ihe mere na-atụ egwu ikwu okwu.
Onye ọzọ bi na Nnobi na-achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo na n'ezie na a dọwara isi mmadụ nakwa akpati ozu n'Afọ Nnobi nakwa akwụkwọ e deere ozi.
"Ihe ha ziri bụ na iwu ịnọ n'ụlọ ụbọchị Monde ọbụla ka na-aga n'ihu."
Ọ kọwara na ahịa amalitela ịzụkwa n'Afọ Nnobi kamgbe otu Ipob kagbuchara atụmatụ 'ịnọ n'ụlọ' ha tinyeburu.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ọ natabeghi ozi maka nke a mana ọ ga-eme nnyocha ihe mere, wetara anyị ozi.
Ka ọ dị ugbua, ndị e chere na ha bụ ndị ọrụ gọọmenti abịala bupu ozu ndị ahụ.
Tigbuo-zogbuo na-arị elu n'Ọwụwa Anyanwụ kemgbe mbido afọ mana ọ dajụrụ dịka ọ fọrọ abalị ole na ole ka e mee ntuliaka gọvanọ Anambara steeti nke e mere n'abalị isii nke ọnwa Novermba afọ a.
Nke a so n' akụkọ ọhụrụ banyere gbuogbuogbuo na-eme n'Ọwụwa Anyanwụ na nsonso a.




























