You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
A na-adọ ndọrọndọrọ maka mwepụ aha Naijiria n'ime mba ndị na-enye ofufe nsogbu
N'ụbọchị Wednezde bụ ụbọchị 17 nke ọnwa Nọvemba, mba Amerịka zipụtara ozi na ha ewepụla aha mba Naijiria na aha ebe ndị a na emegidi ndị mmadụ maka okpukperechi ha, mana ọ dịzị ka ụfọdụ ndị ụkọchụkụ ụka Kraịstị na nke ndịnke alakụba a nọzị na ndọrọndọrọ okwu a.
Ụfọdụ ndị okpukpere chi alakụba gwara BBC Hausa na ha nabatara mwepụ aha Naijiria dịka ha kwuru na Naijiria anaghi emegidi onye maọbụ otu ọbụla maka okpukpere chi h mana otu onye ụkọchụkwụ ụka Kraịstị kwuru na ọ nabataghi nke a.
Lee ihe ndị ọnụ ruru okwu gwara BBC maka ozi na mwepụla aha a Naịjirịa.
Ụkọchụkụ Murtala Mati Dangora bụ osote onyeisi oche otu na-elekọta ndị okpukperechi Kraịstị na Kano steetị nke a na-akpọ na Bekee "Christian Association of Kano State" gwara BBC Hausa na a kana emegidi ndị okpukperechi Kraịstị na Naijirịa dịka ọtụtụ akụkụ Naijiria kana amachị ndị ụka ịrụ ụlọụka ha ebe ha chọrọ.
N'okwu ya, ọ sị: "Dịka mba Amerịka si wepụ aha Naijịrịa na ọnụ ọgụgụ mba ebe ndị a na-emegịdị ndị mmadụ maka okpukperechi ha, mara na ha amaghị akụkọ bụ eziokwu banyere okwu a dịka a na-emegidi ma na-emegbu ndị mmadụ n'okwu okpukperechi ha na ala Naijịrịa"
N'otu aka ahụ ụkọchụkwụ ụka alakụba bụ Muhammad Nurul Khaleed, onye bụkwa otu onyeisi ahụrụ kwaba okpu n'otu the 'Interfaith Dialogue Committee', kwuru na akụkọ mmachi maọbụ mmegidi a adịghị ire n'ala Naijịrịa.
O kwuru na eweghi mkpesa ọbụla banyere nke a ọ ma maka ya.
Ụkọchụkwụ Murtala gara n'ihu kwuo si: "Gọọment Naijịrịa kwesiri inye mmadụ niile ikike diri ha ikpere chi ọbụla ha chọrọ, ha kwesiri ikwe ndị ụka ka ha goro ala ma rụọ ụlọụka ha ebe ha chọrọ, maọbụ nwete ọrụ ebe ha chọrọ."
Muhammad Nurul Khaleed kwuru na Naijiria nwereike inwete udo ma ọ bụrụ na a kwenyere ndị ụkọchụkwụ okpukpere chi dị ịcheịche ugwu ruru ha, gee ha nti ma nye ha ohere inwe mkparịtaụka
Ozi mwepụ aha a bịara tupu onye odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Antony Blinken anwụchịa n'Abuja maka mkparịtaụka pụrụiche ya na onyeisiala Muhammadu Buhari nwere banyere nchekwa ala Naijria na ihe ndị ọzọ.
Cheta na n'afọ gara aga, mba Amerịka gụnyere ala Naijịrịa dịka ebe ndị ekwesiri elebanyere anya n'okwu agwa ọjọọ ha na-akpasi ndị mba ha maka okpukpere chi.
Ụfọdụ mba ndị aha n'okwu a ugbua bụ Myanmar, China, Eritrea, Iran, North Korea, Pakistan, Russia, Saudi Arabia, Tajikistan nakwa Turkmenistan, nke bụ dịka mba Amerịka si depụta.
Agbanyeghi na ewepụla aha mba Naijirịa, mba Amerịka ka gụnyere otu abụọ bụ otu ndị agha nnụpụsi okpukpere alakụba dịka otu ekwesiri inye nlebanye anya pụrụịche - Otu abụọ a bụ: otu Boko Haram na otu Iswap.
Kedụ ihe gọọmentị Naijiria kwuru maka mwepụ aha Naijiria mba Amerịka mere?
Ọnụ na-ekwuru onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Garba Shehu kwuru na ekwesighi ịgụnye aha ala Naijiria dịka ebe a na-emegidi ndị mmadụ maka okpukpere chi ha n'ihi na ya bụ ọnọdụ bụ ihe nghọtaghie nye mba Amerịka dịka ha chere na ndị otu Boko Haram na Iswap na-egbu naani ndị okpukpere chi Kraịstị.
Ọ gara n'ihu kwuo na ya bụ echiche abụghị eziokwu dịka ndị otu a na-egbu ma ndị okpukpere chi Kraịstị ma ndị okpukpere chi alakụba