Davido rịọtara otu nde nari naịra, Yul Edochie, Destiny Etiko, Psquare na ndị ọzọ amalitela iso atumatu ahụ

Mgbe e biputara ya

Dịka otiegwu a ma ama bụ Davido gosiri ụwa na ọ naghị eti mmọwụ a na-akwa aka dịka ndị nso nso ya ji ihe kariri otu narị nde naira gosi ya na ha bụ "a kpọọ, a zaa", ndị ọzọ esorola azọmụkwụ ya ma malite ịrịọ ego nke ha.

Cheta na ihe a malitere dịka Davido ji akara Twitter ya n'ụbọchị Wenezde, Nọvemba 17, 2021, rịọ ndị nso nso ya na ndị na-akwado ya ka ha zitere ya ego n'ọba ego ya.

O depụtakwara akara ụlọakụ ya.

O kwukwara ntụkọta ego ọ chọro n'aka ha bụ otu nari nde Naịra dịka ọ chọro i ji ya gbapụta ngwaahịa na-abata ala Naijiria nso nso a.

Dịka ozipụtechara ya bụ ozi, n'oge ruru nkeji iri, o ji ọnụ na aṅụrị depụta na soshal midia ya na ndị mmadụ eziterela ya nde Naịra asaa, nke mere ya bụ arịrọ jizi sara ọkụ.

Dịka o si kwuo ma gosi kwa site na akara ụlọakụ ya, ndị nkwado ya zitere ya ihe kariri nde Naịra iri ise n'otu elekere.

Ihe nke a turu Davido bụ onye otiegwu e ji aka nkesa mara n'anya dịka n'oge gara gara o na-enyere ọtụtụ ndị mmadụ aka site na inye ego maọbụ ikwado atụmatụ ha.

N'atụmatụ ikwuchi ya ụgwụ obioma ya, ọtụtụ ndị mmadụ pụtara n'igwe tụnyere ya ụtụ ruru ya.

Ụfọdụ ndị ama ama zitere ya ego dịka o si gosi n'aka Instagram ya bụ Obi Cubana, Ubi Franklin, Phyno, Don Jazzy, Ckay, Toke Makinwa, Rema wdgz.

Ndị ọzọ na-eme nke ha

Agwa a Davido kpara kpalitere mmụọ ndị ọzọ ama ama isonye n'ụzọ a, nke gunyere:

Yul Edochie: Yul bụ onye ama ama na-eme ejije Nollywood depụtara na Facebook ya: 'Ekele diri Davdio dịka o gosila anyị ụzọ, ndị nso nso na ndị nkwado m zitere nụ m ego m ga e ji mee achụmtavootu maka ntuliaka ọkwa onyeisiala', o gara n'ihu depụta akara ụlọakụ ya

Destiny Etiko: Nwada Destiny bụ kwa onye na-eme ejiji Nollywood rịọrọ ndị nso nso ya ka ha zitere ya naanị puku ise dịka ọ chọghị ina ha ụtụ otu nde

Psquare: Umu ejima otiegwu ama ama bụ Peter na Paul Okoye sonyekwara n'ụgbọ a dịka taa bụ 18 Nọvemba bụ ụbọchị ncheta omumu ha, ha depụtara akara ụlọakụ ha gwaa ndị nkwado ha ka ha zitere ha ego.

Ha gara n'ihu depụta aha Obi Cubana, nwanna ha nwoke Jude Okoye nakwa Davido ka buru ndị ga-ebu ụzo zitere ha ego

Uju Okoli: Uju bụkwa onye na-eme ejiji Nollywood gwakwara ndị nso nso ya ka ha zitere ya naani otu puku ma kwuo ka ha si n'ụzọ gosi ụwa na ha hụrụ ya n'anya n'ezi a.

Ihe dị otu a o mebuola mbụ?

Nke a abụghị mbụ ndi mmadụ na-apụta n'igwe tụọrọ onye ọgaranya ụtụ ego.

N'afọ 2018, ndị ntaakụkọ CBS zipụtara ozi na ide ego bụ Elon Musk na-edina n'alka nkịtị n'ụlọọrụ ya bụ Tesla.

Akụkọ kpaliri ndị nkwado ya ka ha bido ụtụ ego maka izụtara ya akwa ọ ga-eji na-arahụ ụra.

Ndị mmadụ ji n'akara intanetị a na-akpọ 'Gofundme' tụkọtara ya ego kariri puku dọla asaa ($7000).

N'otu afo ahụ bụ 2018, ndị ụlọọrụ ntaakukọ 'Forbes' depụtara aha nwada Kylie Jenner dịka nwa agbọghọbịa mbụ nọ n'ụzọ ibawanye akụnụba ya ruo otu ijeri dọla.

Ozi kpalịrị mmụo ndị nkwado ya ka ha malite izitere ya ego iji hụ na o ruru ọgọgọ ịbụ ọgaranya nwezuru otu ijeri dọla.

Ụtụ ego atụtara n'isi ya n'ụbọchị nke mbụ ruru dọla puku nari anọ na iri asatọ na isii. ($486,000).