Nedu Wazobia: Etu m si chọpụta na diọkpara m abụghị nwa m

Ebe foto si, Nedu_wazobiafm/Instgram
Esemokwu dapụtara n'etiti onye ekwurekwu a ma ama bụ Chinedu Ani maọbụ 'Nedu Wazobia' bụ okwu akpụ n'ọnụ taa.
Onye bụbu nwunye Nedu bụ Uzoamaka Ohiri pụtara n'abalị Fraịde bo Nedu ebubo iti ya ihe mgbe ha ka bụ di na nwunye.

Ebe foto si, Instagram/Screenshot
O kpọkwara ụlọorụ Nedu bu "WazobiaFM" oku ihe mere he ji hapụ Nedu n'ọkwa ọrụ ya dịka ekwurekwu n'agbanyeghi ihe o mere ya.
Nedu zaghachiri ya taa bụ ụbọchị Satọde ma wepụta ihe akaebe gosiri na nwa mbụ ha nke a sị mere ha ji lụọ onwe ha abụghị nwa Nedu.

Ebe foto si, Screenshot/Nedu_Wazobiafm
Nedụ jikwa ohere ahụ rịọ Uzoamaka bụbu nuwnye ya si ya kwụsị ihe ọ na-eme maka na ụmụ ha ga-etọ chọpụta maka akụkọ a.
"N'okwu gbasara iti ya ihe, ụlọ ndịuwoejii nakwa ụlọikpe enyochaala okwua ma kwuo na aka m kwụ ọtọ" ka Nedu kọwara n'ozi o depụtara n'akara Instagram ya.

























