Onye uweojii 'na-alụrụ enyi ya nwaanyị ọgụ' awakpoola ụmụakwụkwọ Imsu

Mgbe e biputara ya

Dịka mkpu ka na-ada etu ụfọdụ ndị uweojii n'Ịmo Steetị si wakpoo ụmụakwụkwọ na mahdum Imo Steeti Bekee kpọrọ "Imo State University" (Imsu), onyeisi ha ekwuola na ha ga-ebido nnyocha maka agwa ndi otu ya kpasara ụmụakwụkwọ a.

Akụkọ si ụlọakwụkwọ ahụ pụta na ehihe Fraịde na ndị uweojii ole m ole si wakporo ụlọ ezumike ụmụ akwụkwọ ahụ, gbawa ụzọ ụlọ ha ruru iri na ise, tie ụfọdụ ụmụ akwụwkọ ihe ma nwụchịe ndị ọzọ n'ike.

Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ihe mere kwuru na ụmụakwụkwọ sịrị na ihe butere ọgbaghara bụ esomokwu nọ n'etiti ụmụ akwụwkọ nwaanyị abụọ, nke mere otu onye n'ime ha jiri kpoo enyị ya nwoke bụ onye uweojii ka ọ bịa tinyere ya aka.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo sị na ndị hụru oge ihe a mere sị na ndị uweojii ji ụgbọala ha bata wakpoo ụlọ ezumike ụmụ akwụkwọ Imsu dịka esemokwu a na-eme n'abali Tọọzde, n'ebe elekere itolu.

Ụmụakwụkwọ sị na ha tiri mmadụ niile nọ ebe ahụ ihe, merụọ ụfọdụ ahụ, ma nwụchịe ndị ọzọ n'ike.

E kwukwara na ekweghi tọhapụ ndị a nwụchịrị nani ndị kwụrụ ego ruru puku narịa iri isii (₦60,000) maọbụ puku naịra iri atọ (₦30,000), ndị a na-atọhapụghị gụnyere ụmụ akwụkwọ anọ a si na-enweghi ego gbapụta onwe ha.

Mgbe a jụrụ ọnụ na-ekwuchitere mahadum a bụ Ralph Obinjoku maka ihe a mere, o kwuru na ha ndị ọrụ nchekwa ụlọ akwụkwọ ha ebidola ọrụ nyocha imata ihe mere n'ezia.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo Steetị bụ Micheal Abattam zipụtara ozi na Kọmịshọna ndị uweojii na Steetị ahụ bụ Rabiu Hussaini enyela iwu imalitele ọrụ nyocha n'akụkọ a.

N'akwụkwọ ozi ndị uweojii zipụtara maka okwu a n'ụtụtụ Satọde, ha kwuru na dịka ha na-eme ọrụ nnyocha ha hụrụ na ihe mere n'ezia bụ na ọtụ nwata akwụkwọ nwaanyi aha ya bụ Mmeloma Onwuzuruike kporo ha oku gbata gbata na onye na-anoyere ya na ụlọ ezumike ha bụ Iheoma Nwoha na ndị enyi ole m ole na-abasi ya ọgụ.

Ha kwuru na e nyere ndị otu uweojii ikike iwuchi ebe ahụ ma dajuo ya bụ ọgụ.

Akụkọ ha kwukwara na ha nwụchiri ndị niile a si na-alụ ọgụ ma na-ebụte ọgbaghara ebe ahụ.

Ha gara n'ihu tọhapụ ndị niile nwaada Mmeloma Onwuzuruike kwuru n'esoghi lụọ ọgụ ahụ dịka a sị na mmadụ anọ ndị ọzọ so lụọ ọgụ nọrọ dee akụkọ ihe mere tupu atọhapụ ha.

N'akwụkwọ ozi ha, Kọmịshọna ndị uweojii n'Imo Steetị bụ Rabiu Hussaini kelere ụmụ akwụkwọ ka ha si tinye aka nweghichete ụdọ n'ebe ahụ, dịka ọrụ nnyocha ha ka na-aga n'ihu.