Ayamelum LGA: Gịnị na-eme n'etiti ndị Anakụ na Omoku dị n'Anambra steeti?

Mgbe e biputara ya

Ozu mmadụ atọ ka ndị uweojii Anambra steeti hụrụ ka ọ dị ugbua, dịka Tochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ha si kwuo.

Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị obodo Anaku na Omor dị n'okpuruọchịchị Ayamelum banyere ọgụ na mgba nke butekwara ịgba ọtụtụ ụlọ ọkụ.

Ikenga gwara BBC Igbo na ọ bụ esemokwu gbasara ndọrọndọrọ ala butere ọgbaghara a mere n'ụtụtụ Sọnde, Mee 16, 2021.

Ikenga gwaburu BBC Igbo na kọmịshọna uweojii Anambra steeti bụ Monday Bala Kuryas, gara ebe ihe mere. ịga jiri anya ya lee etu ihe si kwụrụ, ka o dupuchara ndị nke ya ebe ahụ.

O kwuru na ka ọ dị ugbua, ihe niile ederela duu n'etiti ndị Anaku na ndị Omor ebe ọ ka na-eche ka ndị otu ya nyekwuo ya ozi gbasara ya bụ ọdachị.

Ndị omekome achụfusiri ndị bi n'ogbe Ifite Isuaniocha community, dị n'okpuruọchịchị Awka North nke Anambra steeti?

Akụkọ ọzọ pụtara na ndị bi n'ogbe Ifite Isuaniochariri mbo mbo ọsọ makana ha hụrụ na soshal midia na ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ndị ha na-eche bụ ndị ọchị ehi gbabatara n'uju.

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na nke ahụ bụ ezigbote asị mabụrụ kepu kepu na-achịtaghị aja maọlị.