Ebonyi attack: Ọ bụ ndị ọchịehi Fulani, ka ọ bụ ndị Agila dị na Benue wakporo ndị Ngbo n'Ebonyi steeti?

Mgbe e biputara ya

A na-enwe nghọtahie ebe ndị ekperima wakporo obdodo Ngbo dị n'okpuruọchịchị Ohaukwu nke Ebonyi Steetị si bịa.

Ndị obodo Ebele, dị na Ngbo gwara BBC na ọ bụ ndị agbataobi ha bụ ndị obodo Agila dị na Benue Steeti wakporo ha n'isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde.

Ụfọdụ ha sị na ọ bụ ọsọ ndụ ka ha gbara dịka e gburu ụfọdụ n'ime ha ma gbaa ụlọ ha ọkụ

Ihe ndị Agila kwuru

Onyeisioche okpuruọchịchị Ado nke Ebonyi Steetị bụ James Oche sị na ọ bụghị ndị obodo Agila dị n'okpuruọchịchị mere mwakpo ahụ.

Ọ sị na o juru ya anya etu gọọmentị Ebonyi si ebo ha ụdị ebubo na enweghi ezi ihe akaebe.

Oche sị na ndị obodo Ngbo adịla mbụ kwuo na ọ bụ ndị ọchịehi wakporo ha.

Ihe gọọmentị Ebonyi kwuru

Kọmishọna mgbasaozi n'Ebonyi Steetị bụ Uchenna Orji kwuru na nyocha mbụ e mere na-arụ aka na ọ bụ ndị Agila wakporo obodo Ngbo.

Ọ sị ọ bụ oge e mere mwakpo na usoro e ji mee ya, gbuo ndị mmadụ na ịgba ụlọụka gosiri na ọ bụ ndị Agila.

Ọ gara n'ihu kwuo na obodo abụọ na-enwekaarị esemokwu ala kamgbe ọtụtụ afọ gara gara.

Na esemokwu ebutela ọtụtụ tara isi ọtụtụ mmadụ dịka gọọmentị steetị abụọ na-achọ ụzọ ime udo.

Ọ sị a ọ dịghị onyeisioche okpuruọchịchị obodo n'aka itinye ọnụ n'okwu a kama na ọ bụ gọọmentị Benue na Ebonyi nwere okwu banyere ya.

Orji sị na nyocha ka na-aga n'ihu inwuchi ndị mere nke a kpọmkwem.

Ihe ndị uweojii Ebonyi Steetị kwuru.

Loveth Odag bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ebonyi Steetị sị na e gburu mmadụ abụọ ma kpọọ ụlọ abụọ ọkụ na nwakpo ahụ.

Na ndị mere mwakpo a si n'agbata ụzọ dị n'obodo Agila na Ngbo bata bịa wakpooo ndị a.

Ọ sị na usoro e ji mee mwakpo a nakwa oge e mere ya na-egosi na ndị a nwereike ịbụ ndị Agila.

Loveth sị na otu aka ahụ na o nwekwara ike bụrụ ndị ọchịehi mere ya n'ihi mkpakpa ha na-akpa na nso a.

Ọ sị na dịka ọ dị ugbua na nyocha tara ọchịchị ka na-aga n'ihu banyere ya.