“Ihe ga-akwụsị ọgụ Agila(Benue) na Ngbo(Ebonyi) bụ itinye oke-ala” -Onyeisi Ohaukwu LGA

Mgbe e biputara ya

Onye isi ọchịchị Ohaukwu LGA bụ Mazi Clement Odah kwuru na ogbugbu ndị Agila si na Benue gburu ndị Ngbo be ha bụ ihe ịgba anya mmiri.

Odah kwuru na ha agwala ndị National Boundary Commission ka mgbe ọtụtụ afọ ka ha tinye oke-ala ga-eme ka esemokwu ala na ogbugbu mmadụ ahụ dị ka mgbe afọ nari n'etiti Ebonyi na Benue bịa n'isi njedebe.

O kwuru na ugbua nani mmadụ itolu nwụnyụrụ anya pii, ma gbakwaa ndị mmadụ ume na igbu mmadụ akwụsịla na Ngbo ugbua.

Akụkọ ndị ga-amasị gị