'Etu e si gbuo ụmụ m n'Ebonyi'- Nwoke e gburu ụmụ ya abụọ

Mgbe e biputara ya

Nwoke Fulani ndị omekome gburu ụmụ ya abụọ na nnukwu ọhịa dị n'Ukwụachi Isieke dị n'Ebonyi steeti ekwuola ka o si mee .

Nwoke ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụ n'elekere asatọ nke mgbede ụbọchị Tuzde, ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Sepụtemba ka ndị omekome ahụ ọ na-eche na ha bụ ndị Ebonyi biara gbuo ụmụ ya abụọ mgbe ha nọ n'ụra.

O kwuru na ha gbukwara ehi atọ.

O kwuru na o nweghị ihe na-eseburu ha ndị Ukwuachi.

Mana Eze ndị Ishieke bụ Patrick Aloo kwuru na aka ndị obodo ya adịghị n'ogbugbu ahụ kama ọ bụ ndị ori biara wakpo ndị Fulani ahụ n'ime ọhia ebe ha bi, gbuo mmadụ abụọ ma meruo otu onye ahụ.

O kwuru na kamgbe afọ iri ha na ndị Fulani na-emekọ ihe, ha enwebeghị nsogbu ọbụla.

Onyeisi ndị ntoroọbịa Isieke bụ Chigozie Alo na-ekwusike na onweghị mgbe ndị Isieke ji wakpo ndị Fulani bi n'etiti ha.

O kwuru na kamgbe afọ iri na isii ha na ndị Fulani bigoro, ha enwebeghị nsogbu ọbụla.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Ebonyi bụ Odah Loveth wepụtara akwụkwọ ozi kọwara etu ihe a si mee.

O kwuru na otu nwoke a kpọrọ Ado Ibrahim bụ onye Fulani na-achị ehi biara kpesa n'ụlọ ọrụ ndị uweojii dị n'Ishieke na mmadụ abụọ ndị omekome gburu n'ogbe ha bụ ụmụụmụ ya.

Ado kọọrọ ha na e gburu ụmụ ya mgbe ha na-arahụ ụra n'elekere itoolu nke mgbede Tuzde mgbe ha chichara ehi.

Odah depụtara na kọmịshọna ndị uweojii gakwara ebe ahụ ihe a mere ma si ka e mee nnyocha ma chọpụta ndị kpara mkpamkpa a.

Ọ na-arịọkwa ka ndị ntoroọbịa nakwa ndị Fulani bi n'Ishieke nọrọ jụụ ghara imalite lusowe onwe ha ọgụ makana ha ga-eme ihe niile ha nwereike ịhụ na eziokwu pụtara ihe.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: