Onweghi ihe ọjọọ Rochas buru Eze Ilomuanya n'obi - Ọnụ na-ekwuchitere Okorocha

Mgbe e biputara ya

Onye bụbu aka na-achị Steeti Imo bụ Rochas Okorocha na onye Eze Obinukwu bụ Eze Cletus Ilomuanya nọrọ n'ụtụtụ ụnyaahụ were egbe ọnụ saa onwe ha ahụ n'ọdọụgbọelu Sam Mbakwe dị n'Owere.

Akụkọ kwuru na Eze Ilomumanya sị na ihe na-eme Okorocha si ya n'aka, ebe Okorocha gwara ya na onweghi obi mwute ịwepụ ya dịka onyeisi ndị Eze ọdịnala n'oge ọ bụ gọvanọ.

Okorocha kwuru na e nyekwuo ya ohere ọzọ ịbụ aka na-achị steeti ahụ, na ọ ga-eme ya ma mekwasị ọzọ.

Okorocha na onye Eze a nọkọrọ ọnụ n'oche n'ime ụgbọelu ahụ mgbe ha bidoro na-abara onwe ha mba.

Ndị nọ n'ụgbọelu ahụ mechara bịa gbosaa Okorocha na Ilomuanya ma nye ha oche na-adịghị nso onwe ha.

Cheta na mgbe Okorocha na-achị dịka gọvanọ Imo Steeti na o wepụrụ Eze Ilomuanya n'ọkwa onyeisi ndị Eze ọdịnala nke steetị ahụ.

Ọnụ na-ekwuru Okorocha bụ Sam Onwuemedo gwara BBC Igbo na ọ nọghị n'ụgbọelu mgbe ihe ahụ mere kama na ọ nụrụ ya n'akụkọ.

Ọ gara n'ihu katọọ agwa Eze Ilomuanya kpara ma sị na onye ọbụla maara Rochas dịka onye udo na ịhụnanya.

Ọ gara n'ihu kwuo na anaghi abụ anụ nwụrụ anwụ n'ezi.

O kwuru na Okorocha ịnọkwuru ya na akụkụ gosiri na o nweghi ihe ọjọọ okorocha buuru ya n'obi.